Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Hagaị 2:1-23

2  N’ọnwa nke asaa,+ n’abalị iri abụọ na otu n’ọnwa ahụ, a nụrụ okwu Jehova site n’ọnụ Hagaị+ onye amụma, sị:  “Biko, gwa Zerọbabel+ nwa Shieltiel,+ bụ́ gọvanọ Juda,+ na Jọshụa+ nwa Jehọzadak,+ bụ́ nnukwu onye nchụàjà na ndị fọdụrụ n’ime ndị Izrel, sị,  ‘Ònye n’ime unu bụ́ ndị fọdụrụ afọdụ hụrụ ụlọ a n’ebube ya mbụ?+ Oleekwa otú ọ dị unu n’anya ugbu a? N’anya+ unu, ọ́ dịghị ka ihe na-abụghị ihe ọ bụla ma e were ya tụnyere nke ahụ?’  “‘Ma ugbu a, dị ike, Zerọbabel,’ ka Jehova kwuru, ‘dịkwa ike,+ Jọshụa nwa Jehọzadak, bụ́ nnukwu onye nchụàjà.’ “‘Dịkwanụ ike, unu niile bụ́ ndị bi n’ala a,’ ka Jehova kwuru, ‘rụọkwanụ ọrụ.’+ “‘N’ihi na anọnyeere m unu,’+ ka Jehova nke ụsụụ ndị agha kwuru.  ‘Chetanụ ihe ahụ mụ na unu gbara ndụ banyere ya mgbe unu si n’Ijipt+ pụta, mgbe mmụọ+ m guzo n’etiti unu. Unu atụla egwu.’”+  “N’ihi na nke a bụ ihe Jehova nke ụsụụ ndị agha kwuru, ‘Ọ ka fọrọ otu ugboro—ọ bụ n’oge na-adịghị anya+—m ga-eme ka eluigwe na ụwa na oké osimiri na ala akọrọ maa jijiji.’+  “‘M ga-eme ka mba niile maa jijiji, ihe a na-achọsi ike nke mba niile ga-abata;+ m ga-emekwa ka ụlọ a jupụta n’ebube,’+ ka Jehova nke ụsụụ ndị agha kwuru.  “‘Ọlaọcha bụ nke m, ọlaedo bụkwa nke m,’+ ka Jehova nke ụsụụ ndị agha kwuru.  “‘Ebube ụlọ nke ikpeazụ a ga-adị ukwuu karịa nke mbụ,’+ ka Jehova nke ụsụụ ndị agha kwuru. “‘M ga-emekwa ka udo dị n’ebe a,’+ ka Jehova nke ụsụụ ndị agha kwuru.” 10  N’abalị iri abụọ na anọ n’ọnwa nke itoolu, n’afọ nke abụọ nke ọchịchị Darayọs, okwu Jehova ruru Hagaị+ onye amụma ntị, sị: 11  “Nke a bụ ihe Jehova nke ụsụụ ndị agha kwuru, ‘Biko, jụọ ndị nchụàjà ajụjụ banyere iwu+ ahụ, sị: 12  “Ọ bụrụ na mmadụ eburu anụ dị nsọ n’ala ala uwe mwụda ya, ala ala uwe ya wee metụ achịcha ma ọ bụ ofe ma ọ bụ mmanya ma ọ bụ mmanụ ma ọ bụ ụdị ihe oriri ọ bụla, ọ̀ ga-aghọ ihe dị nsọ?”’”+ Ndị nchụàjà ahụ wee zaa, sị: “Ee e!” 13  Hagaị wee gaa n’ihu ịsị: “Ọ bụrụ na onye mkpụrụ obi nwụrụ anwụ mere ka ọ ghara ịdị ọcha emetụ nke ọ bụla n’ime ihe ndị a ahụ́, ọ̀ ga-aghọ ihe na-adịghị ọcha?”+ Ndị nchụàjà wee zaa, sị: “Ọ ga-aghọ ihe na-adịghị ọcha.” 14  Hagaị wee zaa, sị: “‘Ọ bụ otú ahụ ka ndị a dị, otú ahụ ka mba a dịkwa n’ihu m,’+ ka Jehova kwuru, ‘otú ahụ ka ọrụ aka ha niile dịkwa, tinyere ihe ọ bụla ha na-eweta n’ebe ahụ. Ọ bụ ihe na-adịghị ọcha.’+ 15  “‘Ma, ugbu a, biko, chebaranụ ihe a echiche+ malite taa gaa n’ihu, tupu a tụkwasị nkume n’elu nkume n’ụlọ nsọ Jehova,+ 16  malite mgbe ihe ndị ahụ bidoro ime—mmadụ bịara n’ikpo ihe nke dị ọ̀tụ̀tụ̀ sia iri abụọ, ya adịzie iri; mmadụ bịara n’olulu a na-azọchapụta mmanya ka o kuru ọ̀tụ̀tụ̀ iri ise n’ebe nzọchapụta mmanya, ya adịzie iri abụọ;+ 17  emere m ka okpomọkụ+ na ịma ebu+ na akụ́ mmiri ígwé+ bịakwasị unu, bịakwasịkwa ọbụna ọrụ aka unu niile,+ ọ dịghịkwa onye unu na ya nọ nke na-echigharịkwute m,’+ ka Jehova kwuru— 18  “‘Biko, chebaranụ ihe a echiche+ malite taa gaa n’ihu, malite n’abalị iri abụọ na anọ n’ọnwa nke itoolu, malite n’ụbọchị a tọrọ ntọala ụlọ nsọ Jehova;+ chebaranụ ihe a echiche: 19  Mkpụrụ ọ̀ ka dị n’ebe a na-echekwa mkpụrụ?+ Ruokwa ugbu a, osisi vaịn na osisi fig na osisi pọmigranet na osisi oliv amịbeghị mkpụrụ, ka ọ̀ mịwo? Malite taa, m ga-awụkwasị unu ngọzi.’”+ 20  Okwu Jehova wee ruo Hagaị+ ntị nke ugboro abụọ n’abalị iri abụọ na anọ n’ọnwa+ ahụ, sị: 21  “Gwa Zerọbabel, bụ́ gọvanọ Juda+ sị, ‘M ga-eme ka eluigwe na ụwa maa jijiji.+ 22  M ga-akwatukwa ocheeze nke alaeze dị iche iche, mee ka ike alaeze nke mba+ dị iche iche laa n’iyi; m ga-akwatukwa ụgbọ ịnyịnya+ na ndị na-agba ha, ịnyịnya na ndị na-agba ha ga-anwụkwa, onye ọ bụla site ná mma agha nwanne ya.’”+ 23  “‘N’ụbọchị ahụ,’ ka Jehova nke ụsụụ ndị agha kwuru, ‘m ga-akpọrọ gị, Zerọbabel+ nwa Shieltiel,+ bụ́ ohu m,’ ka Jehova kwuru; ‘m ga-emekwa ka ị bụrụ mgbaaka e ji aka ihe akara,+ n’ihi na ọ bụ gị bụ onye m họọrọ,’+ ka Jehova nke ụsụụ ndị agha kwuru.”+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji