Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet | BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Hagaị 1:1-15

1  N’afọ nke abụọ nke ọchịchị Darayọs bụ́ Eze,+ n’ọnwa nke isii, n’abalị mbụ n’ọnwa ahụ, okwu Jehova si n’ọnụ Hagaị+ onye amụma ruo Zerọbabel+ nwa Shieltiel,+ bụ́ gọvanọ Juda,+ na Jọshụa+ nwa Jehọzadak,+ bụ́ nnukwu onye nchụàjà, ntị, sị:  “Nke a bụ ihe Jehova nke ụsụụ ndị agha+ kwuru, ‘Ndị a asịwo: “Oge erubeghị, oge a ga-ewu ụlọ Jehova.”’”+  Okwu Jehova wee na-abịa site n’ọnụ Hagaị onye amụma, sị:  “Ugbu a ọ̀ bụ oge unu onwe unu ga-ebi n’ụlọ unu e ji osisi machie ahụ́ ya,+ ebe ụlọ a bụ mkpọmkpọ ebe?+  Nke a bụ ihe Jehova nke ụsụụ ndị agha kwuru, ‘Chebaranụ ụzọ unu echiche.+  Unu akụwo mkpụrụ nke ukwuu, ma unu na-ewebata ihe dị ntakịrị.+ Unu na-eri ihe, ma unu adịghị eriju afọ.+ Unu na-aṅụ ihe ọṅụṅụ, ma ọ bụghị ruo n’ókè nke mmanya igbu unu. Unu na-eyi uwe, ma ọ dịghị onye ahụ́ na-ekporo ọkụ; onye na-arụ ọrụ ngo na-arụta ego na-etinye n’akpa puru epu.’”+  “Nke a bụ ihe Jehova nke ụsụụ ndị agha kwuru, ‘Chebaranụ ụzọ unu echiche.’+  “‘Gbagoonụ n’ugwu, bubatanụ osisi.+ Wuokwanụ ụlọ a,+ ka o wee mee m obi ụtọ,+ ka e wee nye m otuto,’+ ka Jehova kwuru.”  “‘Unu lere anya inweta ihe dị ukwuu, ma, lee, unu nwetara naanị ntakịrị ihe;+ unu ewebatawokwa ya n’ụlọ, afụkwara m ya ọnụ+—n’ihi gịnị?’+ ka Jehova nke ụsụụ ndị agha kwuru. ‘N’ihi ụlọ m nke bụ́ mkpọmkpọ ebe, ebe unu na-agbagharị, onye ọ bụla n’ihi ụlọ nke ya.+ 10  Ya mere, eluigwe mere ka igirigi ya ghara ịdara unu, ala n’onwe ya amịghịkwa mkpụrụ ya.+ 11  Anọgidekwara m na-ekwu ka elu ala na ugwu kpọọ nkụ, ka o metụtakwa ọka* na mmanya ọhụrụ+ na mmanụ na ihe ala ga-epupụta na mmadụ na anụ ụlọ na ihe niile unu dọgbuuru onwe unu n’ọrụ.’”+ 12  Zerọbabel+ nwa Shieltiel, na Jọshụa nwa Jehọzadak,+ bụ́ nnukwu onye nchụàjà, na ndị niile fọdụrụ n’ime ndị Izrel, wee malite ige ntị n’olu Jehova bụ́ Chineke+ ha, nakwa n’ihe Hagaị+ onye amụma na-ekwu, dị ka Jehova bụ́ Chineke ha ziri ya; ha wee malite ịtụ egwu n’ihi Jehova.+ 13  Hagaị bụ́ onye ozi+ Jehova wee gaa n’ihu ịgwa ha okwu dị ka ọrụ Jehova+ nyere onye ozi ahụ si dị, sị: “‘Anọnyeere m unu,’+ ka Jehova kwuru.” 14  Jehova wee kpalie mmụọ+ Zerọbabel nwa Shieltiel, bụ́ gọvanọ Juda, kpaliekwa mmụọ Jọshụa+ nwa Jehọzadak, bụ́ nnukwu onye nchụàjà, nakwa mmụọ nke ndị niile fọdụrụ n’ime ndị Izrel; ha wee na-abata, na-arụ ọrụ dị n’ụlọ Jehova nke ụsụụ ndị agha, bụ́ Chineke ha.+ 15  Ọ bụ n’abalị iri abụọ na anọ n’ọnwa nke isii n’afọ nke abụọ nke ọchịchị Darayọs+ bụ́ eze.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ọka a na-ekwu okwu ya ebe a bụ ụdị dị ka ọka wit na ọka bali