Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Habakọk 2:1-20

2  N’ebe m na-anọ eche nche ka m ga na-eguzo,+ m ga na-anọkwa n’elu mgbidi siri ike; m ga-anọ na nche+ ka m hụ ihe ọ ga-esi n’ọnụ m kwuo+ nakwa ihe m ga-aza mgbe ọ dọrọ m aka ná ntị.+  Jehova wee zaa m, sị: “Dee ọhụụ a ede, depụtakwa ya nke ọma n’elu mbadamba nkume,+ ka onye na-agụ ya wee gụọ ya were were.+  N’ihi na ọhụụ a bụ maka oge a kara aka,+ o jikwa ọsọ na-eru ọgwụgwụ ya, ọ gaghị agha ụgha. Ọ bụrụgodị na o gbuo oge, na-atụ anya ya; n’ihi na ọ ga-emezurịrị.+ Ọ gaghị anọ ọdụ.  “Lee! Mkpụrụ obi ya afụliwo onwe ya elu;+ o zighị ezi n’ime onwe ya. Ma onye ezi omume ga-esi n’ikwesị ntụkwasị obi ya dị ndụ.+  N’ihi na mmanya na-aghọ aghụghọ,+ dimkpa na-anya isi;+ ọ gaghịkwa eru ihe mgbaru ọsọ ya,+ ya bụ, onye mere ka mkpụrụ obi ya saa mbara dị ka Shiol, onye yikwara ọnwụ, onye afọ na-adịghị eju eju.+ Ọ na-achịkọtakwara onwe ya mba niile, na-achịkọtakwara onwe ya ndị niile.+  Ọ̀ bụ na ndị a niile agaghị eji ya na-atụ ilu,+ na-akwa ya emo, na-ekwukwa ihe na-adịghị mma banyere ya? Ndị mmadụ ga-asịkwa, “‘Ahụhụ ga-adịrị onye na-enweta ọtụtụ ihe na-abụghị nke ya+—ruo ole mgbe!+—onye na-ekotere onwe ya ụgwọ dị ukwuu!  Ọ̀ bụ na ndị na-anara gị ọmụrụ nwa agaghị ebili na mberede, ọ̀ bụ na ndị na-enusi gị aka ike agaghịkwa eteta, i wee ghọọrọ ha ihe nkwakọrọ?+  Ebe ọ bụ na i bukọọrọ ihe ọtụtụ mba, ndị niile fọdụrụ ná mba ndị ahụ ga-ebukọrọ ihe gị,+ n’ihi ọbara ndị mmadụ ị wụfuru nakwa n’ihi ihe ike i mesoro elu ala, obodo ahụ na ndị niile bi n’ime ya.+  “‘Ahụhụ ga-adịrị onye na-enwetara ụlọ ya uru ọjọọ,+ iji kpaa akwụ ya n’ebe dị elu, ka e wee napụta ya n’ọdachi!+ 10  Ị kpawo nkata ọjọọ nke wetaara ụlọ gị ihe ihere, bụ́ igbuchapụ ọtụtụ ndị;+ mkpụrụ obi gị na-emekwa mmehie.+ 11  N’ihi na nkume ga-esi ná mgbidi kwaa ákwá arịrị, ntụhie ga-esikwa n’elu ụlọ zaghachi ya.+ 12  “‘Ahụhụ ga-adịrị onye na-eji mwụfu ọbara na-ewu obodo, onye ji ajọ omume mee ka obodo guzosie ike!+ 13  Lee! Ọ́ bụghị Jehova nke ụsụụ ndị agha na-eme ka ọkụ gbaa ihe niile ndị mmadụ dọgbuuru onwe ha n’ọrụ, na-emekwa ka mba dị iche iche rụtara onwe ha ike ọgwụgwụ n’efu?+ 14  N’ihi na ụwa ga-ejupụta n’ịmara ebube Jehova dị ka mmiri na-ekpuchi oké osimiri.+ 15  “‘Ahụhụ ga-adịrị onye na-enye ndị ibe ya ihe ka ha ṅụọ, na-atụkwasị ya ọnụma ya na iwe ya, iji mee ka ha ṅụbiga mmanya ókè,+ ka o wee kirie ọtọ ha.+ 16  Ihere ga-eju gị afọ, ọ bụghị otuto.+ Gị onwe gị kwa ṅụọ ihe ọṅụṅụ,+ ka e werekwa gị dị ka onye a na-ebighị úgwù.+ Iko dị n’aka nri Jehova ga-abịara gị,+ ùgwù gị ga-akpụkwa n’ala; 17  n’ihi na ihe ike i mere Lebanọn+ nakwa mbibi i bibiri ụmụ anụmanụ ndị na-emenye ha ụjọ ga-ekpuchi gị, n’ihi ọbara ndị mmadụ ị wụfuru nakwa n’ihi ihe ike i mesoro elu ala,+ obodo ahụ na ndị niile bi n’ime ya.+ 18  Olee uru ihe oyiyi a pịrị apị+ na ihe oyiyi a wụrụ awụ na onye na-ezi ozizi ụgha+ bara nke mere onye rụrụ ya ji rụọ ya, nke mere o ji tụkwasị ya obi,+ o wee mee chi na-abaghị uru, bụ́ ndị na-adịghị ekwu okwu?+ 19  “‘Ahụhụ ga-adịrị onye na-asị mkpirisi osisi: “Teta!” onye na-asịkwa nkume na-apụghị ikwu okwu: “Teta! Ya onwe ya ga-enye ntụziaka”!+ Lee! E ji ọlaedo na ọlaọcha machie ya,+ ume ndụ ọ bụla adịghị n’ime ya.+ 20  Ma Jehova nọ n’ụlọ nsọ ya.+ Derenụ duu n’ihu ya, unu ụwa dum!’”+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji