Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet | BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Emọs 1:1-15

1  Okwu Emọs, onye so ná ndị Tekoa+ na-akpa atụrụ, bụ́ nke a gwara ya n’ọhụụ ọ hụrụ banyere Izrel+ n’ụbọchị Ọzaya+ eze Juda nakwa n’ụbọchị Jeroboam+ nwa Joash+ eze Izrel, afọ abụọ tupu e nwee ala ọma jijiji.+  O wee sị: “Jehova ga-esi na Zayọn bigbọọ,+ ọ ga-esikwa na Jeruselem mee ka a nụ olu ya;+ ala ịta ahịhịa nke ndị ọzụzụ atụrụ ga-eru uju, elu elu ugwu Kamel ga-akpọkwa nkụ.”+  “Nke a bụ ihe Jehova kwuru, ‘“N’ihi nnupụisi atọ nke Damaskọs nupụrụ+ nakwa n’ihi nnupụisi anọ o nupụrụ, m gaghị eme ka ọ laghachi azụ, n’ihi nticha ha ji ọbụna ígwè e ji etichapụta mkpụrụ tichaa Gilied.+  M ga-eme ka ọkụ gbaa+ ụlọ Hazel,+ ọ ga-erepịakwa ụlọ elu niile nke Ben-hedad.+  M ga-agbajikwa ihe ntụchi Damaskọs,+ bipụ onye bi na Bikat-evin, bipụkwa onye ji mkpanaka eze na Bet-iden; a ga-adọrọ ndị Siria n’agha laa Kia,”+ ka Jehova kwuru.’  “Nke a bụ ihe Jehova kwuru, ‘“N’ihi nnupụisi atọ nke Geza nupụrụ+ nakwa n’ihi nnupụisi anọ o nupụrụ, m gaghị eme ka ọ laghachi azụ, n’ihi na ha kpọọrọ ìgwè ndị niile a dọọrọ n’agha+ kpọnye Idọm.+  M ga-eme ka ọkụ gbaa mgbidi Geza.+ Ọ ga-erepịa ụlọ elu ya niile.  M ga-ebipụ onye bi n’Ashdọd,+ bipụkwa onye ji mkpanaka eze n’Ashkelọn.+ M ga-eme ka aka m bịakwasị+ Ekrọn,+ ndị fọdụrụ ná ndị Filistia ga-alakwa n’iyi,”+ ka Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru.’  “Nke a bụ ihe Jehova kwuru, ‘N’ihi nnupụisi atọ nke Taya nupụrụ+ nakwa n’ihi nnupụisi anọ o nupụrụ, m gaghị eme ka ọ laghachi azụ, n’ihi na ọ kpọọrọ ìgwè ndị niile a dọọrọ n’agha kpọnye Idọm nakwa n’ihi na ha echetaghị ọgbụgba ndụ nwanne na nwanne.+ 10  M ga-emekwa ka ọkụ gbaa mgbidi Taya, ọ ga-erepịakwa ụlọ elu ya niile.’+ 11  “Nke a bụ ihe Jehova kwuru, ‘N’ihi nnupụisi atọ nke Idọm nupụrụ+ nakwa n’ihi nnupụisi anọ o nupụrụ, m gaghị eme ka ọ laghachi azụ, n’ihi na o ji mma agha chụọ nwanne ya ọsọ+ nakwa n’ihi na o meghịrị ya ebere,+ o ji iwe ya na-adọri anụ ruo mgbe ebighị ebi; o bukwa ọnụma n’obi ruo mgbe niile.+ 12  M ga-emekwa ka ọkụ gbaa Timan,+ ọ ga-erepịakwa ụlọ elu niile nke Bọzra.’+ 13  “Nke a bụ ihe Jehova kwuru, ‘“N’ihi nnupụisi atọ nke ụmụ Amọn nupụrụ+ nakwa n’ihi nnupụisi anọ o nupụrụ, m gaghị eme ka ọ laghachi azụ,+ n’ihi na ha bọwara ndị inyom Gilied dị ime afọ, iji mee ka ókèala ha saa mbara.+ 14  M ga-amụnye mgbidi Raba ọkụ.+ Ọ ga-erepịa ụlọ elu ya niile, mgbe a na-eti mkpu agha n’ụbọchị agha, mgbe oké ifufe na-efe n’ụbọchị ifufe mmiri.+ 15  A ga-adọrọkwa eze ha n’agha, dọrọkọta ya na ndị isi ya,”+ ka Jehova kwuru.’

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji