Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet | BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Diuterọnọmi 5:1-33

5  Mozis wee kpọkọta Izrel dum wee sị ha: “Izrel,+ nụrụnụ ụkpụrụ na mkpebi ikpe+ ndị m na-ekwu ná ntị unu taa, mụtakwanụ ha ma lezienụ anya ka unu mee ha.+  Anyị na Jehova bụ́ Chineke anyị gbara ndụ na Horeb.+  Ọ bụghị nna nna anyị hà ka ha na Jehova gbara ndụ a, kama ọ bụ anyị na ya, anyị niile ndị dị ndụ taa.  Jehova si n’etiti ọkụ gwa unu okwu ihu na ihu n’ugwu ahụ.+  M guzo n’agbata unu na Jehova n’oge ahụ+ iji gwa unu ihe Jehova kwuru, (n’ihi na unu tụrụ egwu n’ihi ọkụ ahụ, unu agbagoghịkwa n’ugwu ahụ,)+ sị,  “‘Abụ m Jehova bụ́ Chineke gị,+ onye kpọpụtara gị n’ala Ijipt, n’ụlọ ndị ohu.+  Ya adịla mgbe ị ga-enwe chi ọ bụla ọzọ tinyere m.+  “‘Emerela onwe gị ihe oyiyi a pịrị apị,+ ọdịdị+ ọ bụla nke yiri ihe ọ bụla dị n’eluigwe ma ọ bụ nke dị n’elu ụwa ma ọ bụ nke dị na mmiri n’okpuru ụwa.  Akpọrọla ha isiala, ekwekwala ka e duba gị n’ife ha ofufe,+ n’ihi na mụ onwe m bụ́ Jehova Chineke gị bụ Chineke nke chọrọ ofufe a na-ekewaghị ekewa,+ onye na-enye ndị bụ́ ụmụ ntaramahụhụ maka njehie nna ha, na-enyekwa ọgbọ nke atọ na ọgbọ nke anọ, ma ọ bụrụ ndị kpọrọ m asị;+ 10  ma na-egosi ọbụna otu puku ọgbọ obiọma,* ma ọ bụrụ ndị hụrụ m n’anya ma na-edebe ihe m nyere n’iwu.+ 11  “‘Ejila aha Jehova bụ́ Chineke gị eme ihe efu,+ n’ihi na Jehova agaghị ahapụ onye ọ bụla nke ji aha ya eme ihe efu n’enyeghị ya ntaramahụhụ.+ 12  “‘Debe ụbọchị izu ike iji doo ya nsọ, dị nnọọ ka Jehova bụ́ Chineke gị nyere gị n’iwu,+ 13  ị ga-eji ụbọchị isii+ jee ozi ma rụọ ọrụ gị niile. 14  Ma ụbọchị nke asaa bụ ụbọchị izu ike nye Jehova bụ́ Chineke gị.+ Arụla ọrụ ọ bụla,+ gị onwe gị ma ọ bụ nwa gị nwoke ma ọ bụ nwa gị nwaanyị ma ọ bụ ohu gị nwoke ma ọ bụ ohu gị nwaanyị ma ọ bụ ehi gị ma ọ bụ ịnyịnya ibu gị ma ọ bụ anụ ụlọ gị ọ bụla ma ọ bụ onye mbịarambịa nke bi n’ime obodo gị,+ ka ohu gị nwoke na ohu gị nwaanyị wee zuo ike dị ka gị onwe gị ga-ezu.+ 15  Cheta na ị ghọrọ ohu n’ala Ijipt,+ Jehova bụ́ Chineke gị wee jiri aka dị ike na ogwe aka ọ gbatịrị agbatị+ kpọpụta gị n’ebe ahụ. Ọ bụ ya mere Jehova bụ́ Chineke gị ji nye gị iwu ka ị na-edebe ụbọchị izu ike.+ 16  “‘Sọpụrụ nna gị na nne gị,+ dị nnọọ ka Jehova bụ́ Chineke gị nyere gị n’iwu; ka ụbọchị gị wee dị ogologo, ka ihe wee gaziere gị+ n’ala ahụ Jehova bụ́ Chineke gị ga-enye gị. 17  “‘Egbula ọchụ.+ 18  “‘Akwala iko.+ 19  “‘Ezula ohi.+ 20  “‘Agbagidela mmadụ ibe gị akaebe ụgha.+ 21  “‘Agụụ nwunye mmadụ ibe gị agụla gị.+ Ka ịchọ ọdịmma onwe gị naanị ghara ime ka ụlọ mmadụ ibe gị, ubi ya ma ọ bụ ohu ya nwoke ma ọ bụ ohu ya nwaanyị, ehi ya ma ọ bụ ịnyịnya ibu ya ma ọ bụ ihe ọ bụla bụ́ nke mmadụ ibe gị, gụọ gị agụụ.’+ 22  “Okwu ndị a ka Jehova si n’etiti ọkụ,+ ígwé ojii na oké ọchịchịrị gwa ọgbakọ unu dum n’olu dara ụda n’ugwu ahụ, ọ dịghịkwa ihe ọ gbakwụnyere; e mesịa, o dere ha n’elu mbadamba nkume abụọ ma were ha nye m.+ 23  “O wee ruo na ozugbo unu nụrụ olu ahụ nke si n’etiti ọchịchịrị ahụ kwuo okwu, ka ugwu ahụ nọ na-ere ọkụ,+ unu bịara m nso, ya bụ, ndị isi niile nke ebo unu na ndị okenye unu. 24  Unu wee sị, ‘Lee, Jehova bụ́ Chineke anyị egosiwo anyị ebube ya na ịdị ukwuu ya, anyị anụwokwa olu ya n’etiti ọkụ.+ Anyị ahụwo taa na Chineke nwere ike ịgwa mmadụ okwu, onye ahụ aka dị ndụ.+ 25  Ugbu a, gịnị mere anyị ga-eji nwụọ, n’ihi na oké ọkụ a nwere ike iregbu anyị?+ Ọ bụrụ na anyị anụ olu Jehova bụ́ Chineke anyị ọzọ, anyị ga-anwụkwa.+ 26  N’ihi na, ònye n’etiti anụ ahụ́ niile nụtụrụla olu Chineke nke dị ndụ+ ka o si n’etiti ọkụ na-ekwu okwu dị ka anyị nụrụ ya ma ka dịrị ndụ? 27  Gị onwe gị, garuo nso nụ ihe niile Jehova bụ́ Chineke anyị ga-ekwu; ọ bụkwa gị ga-agwa anyị ihe niile Jehova bụ́ Chineke anyị ga-agwa gị,+ anyị ga-anụkwa ha ma mee ha.’ 28  “Ya mere, Jehova nụrụ ihe unu kwuru mgbe unu gwara m okwu, Jehova wee sị m, ‘Anụwo m ihe ndị a kwuru, bụ́ ihe ha gwara gị. Ihe niile ha kwuru dị mma.+ 29  A sị nnọọ na ha ga-azụlite obi ha nke a ịtụ egwu m+ nakwa idebe ihe niile m nyere n’iwu+ mgbe niile, ka ihe wee gaziere ha na ụmụ ha ruo mgbe ebighị ebi!+ 30  Gaa sị ha: “Laghachinụ n’ụlọikwuu unu.” 31  Ma gị onwe gị, guzo n’ebe a m nọ, ka m gwa gị ihe niile m nyere n’iwu na ụkpụrụ na mkpebi ikpe ndị ị ga-akụziri ha,+ ndị ha ga-edebekwa n’ala ahụ m na-enye ha ka ọ bụrụ nke ha.’ 32  Lezienụ anya ime nnọọ dị ka Jehova bụ́ Chineke unu nyere unu n’iwu.+ Unu ahapụla ya gaa n’aka nri ma ọ bụ n’aka ekpe.+ 33  Jeenụ ije n’ụzọ+ niile Jehova bụ́ Chineke unu nyere unu n’iwu, ka unu wee dị ndụ, ka ihe wee gaziere unu,+ ka ụbọchị unu ga-ebi n’ala ahụ unu ga-enweta wee dịkwa ogologo.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ, “ịhụnanya na-adịgide adịgide.”