Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet | BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Diuterọnọmi 32:1-52

32  “Eluigwe, ṅaa ntị ka m kwuo okwu;Ka ụwa nụrụkwa okwu ọnụ m.+   Ntụziaka m ga na-atasị dị ka mmiri ozuzo,+Okwu m ga na-adasị dị ka igirigi,+Dị ka mmiri nke na-avụsị n’elu ahịhịa,+Dịkwa ka mmiri nke na-ezosi ike n’elu ahịhịa ndụ.+  N’ihi na m ga-akpọsa aha Jehova.+Kwuonụ na Chineke anyị dị ukwuu!+   Oké Nkume ahụ, ihe zuru okè ka ọrụ ya bụ,+N’ihi na ụzọ ya niile bụ ikpe ziri ezi.+Chineke nke kwesịrị ntụkwasị obi,+ onye ikpe na-ezighị ezi na-adịghị n’ebe ọ nọ;+Onye ezi omume na onye ziri ezi ka ọ bụ.+   Ha onwe ha emewo omume na-eweta mbibi;+Ha abụghị ụmụ ya, ọ bụ ha nwere ntụpọ.+Ọgbọ gbagọrọ agbagọ ma hịgọọ ahịgọ!+   Ọ̀ bụ Jehova ka unu na-emeso otú a,+Unu ndị nzuzu na-amaghị ihe?+Ọ́ bụghị ya bụ Nna gị nke mụrụ gị,+Onye kere gị wee mee ka ị kwụsie ike?+   Cheta ụbọchị ndị gara aga,+Chebaranụ afọ ndị gara aga site n’ọgbọ ruo n’ọgbọ echiche;Jụọ nna gị, ọ pụrụ ịkọrọ gị;+Jụọkwa ndị agadi gị, ha pụrụ ịgwa gị ya.+   Mgbe Onye Kasị Elu nyere mba dị iche iche ihe nketa,+Mgbe o kewara ụmụ Adam, otu onye n’ebe ibe ya nọ,+O wee kpaara ndị dị iche iche ókè+Dị ka ọnụ ọgụgụ ụmụ Izrel si dị.+   N’ihi na òkè Jehova bụ ndị ya;+Jekọb bụ òkè o ketara.+ 10  O wee chọta ya n’ala ịkpa,+N’ọzara nke tọgbọ nkịtị, nke anụmanụ na-agbọ ụja na ya.+Ọ malitere ịgba ya gburugburu,+ iji lekọta ya,+Iji chebe ya dị ka nwa anya ya.+ 11  Dị nnọọ ka ugo si akpasu akwụ́ ya,Na-erugharị n’elu ụmụ ya,+Gbasaa nku ya, buru ha,Buru ha na nku ya,+ 12  Ọ bụ naanị Jehova nọ na-edu ya,+E nweghịkwa chi mba ọzọ so ya.+ 13  Ọ nọ na-eme ka ọ nọkwasị n’ebe ndị dị elu n’ụwa,+O wee rie mkpụrụ si n’ubi.+O mere ka ọ na-aracha mmanụ aṅụ nke si na nkume dị elu,+Na mmanụ nke si n’oké nkume siri ike;+ 14  Mmiri ara ehi rahụrụ arahụ na mmiri ara nke ewu na atụrụ,+Tinyere abụba ebule,Nakwa ebule, ụdị nke Beshan, na mkpi,+Tinyere ọka wit kasị mma;+Ị nọkwa na-aṅụ ọbara mkpụrụ vaịn dị ka mmanya.+ 15  Mgbe Jeshurọn+ malitere ịma abụba, o wee nupụ isi.+Ị mawo abụba, ị gbawo agba, i ribawo afọ.+O wee gbahapụ Chineke, onye kere ya,+Ledakwa Oké Nkume+ nke nzọpụta ya anya. 16  Ha malitere iji chi ala ọzọ+ kpalie ya ikwo ekworo;+Ha nọkwa na-eji ihe arụ dị iche iche na-akpasu ya iwe.+ 17  Ha wee na-achụrụ ndị mmụọ ọjọọ àjà, ọ bụghị Chineke,+Ya bụ, chi dị iche iche ha na-amabughị,+Bụ́ ndị ọhụrụ batara n’oge na-adịbeghị anya,+Ndị nna nna unu hà na-amaghị. 18  I wee chefuo Oké Nkume nke mụrụ gị,+I wee malite iwepụ Chineke n’echiche, bụ́ Onye mụpụtara gị dị ka à ga-asị na ime mere ya.+ 19  Mgbe Jehova hụrụ ya, ọ kwụsịrị ịkwanyere ha ùgwù,+N’ihi iwe ụmụ ya ndị ikom na ụmụ ya ndị inyom kpasuru ya. 20  O wee sị, ‘Ka m wepụ ihu m n’ebe ha nọ,+Ka m hụ ihe ga-emesị bụrụ ọgwụgwụ ha.N’ihi na ha bụ ọgbọ rụrụ arụ,+Ụmụ na-ekwesịghị ntụkwasị obi.+ 21  Ha onwe ha ejiriwo ihe na-abụghị chi kpalie m ikwo ekworo;+Ha ejiriwo arụsị ha na-abaghị n’ihe+ kpasuo m iwe;Mụ onwe m ga-ejikwa ndị na-enweghị ihe ha bụ kpalie ha ikwo ekworo;+M ga-eji mba nzuzu kpasuo ha iwe.+ 22  N’ihi na iwe m enwuruwo dị ka ọkụ,+Ọ ga-erekwa ọkụ gbadaruo Shiol, n’ebe dị n’ime ime ala,+Ọ ga-erechapụkwa ala na mkpụrụ ya,+Sunyekwa ntọala ugwu ọkụ.+ 23  M ga-eme ka ọtụtụ ọdachi dakwasị ha;+M ga-agba ha akụ́ m.+ 24  Ike ga-agwụ ha n’ihi agụụ,+ oké ahụ́ ọkụ ga-eripịakwa ha,+Ya na ajọ mbibi.+M ga-ezitekwa anụ ọhịa ka ha taa ha,+Ha na anụ ndị na-akpụ n’ala ka ha tanye ha elò n’ahụ́.+ 25  Mma agha ga-agbawa ha aka nwa n’èzí,+Ụjọ ga-adịkwa n’ime ụlọ,+Gbawa ha aka ma nwa okorobịa ma nwa agbọghọ na-amaghị nwoke,+Nwa na-aṅụ ara na nwoke isi awọ́.+ 26  M gaara asị: “M ga-achụsasị ha,+M ga-eme ka a kwụsị ịkpọtụ aha ha n’etiti mmadụ efu,”+ 27  Ma ọ́ bụghị na m tụrụ egwu iwe onye iro,+Na ndị na-emegide ha pụrụ ịghọtahie ya,+Na ha pụrụ ịsị: “Aka anyị akawo ike,+Ọ bụghịkwa Jehova mere ihe a dum.”+ 28  N’ihi na ha bụ mba nke na-enweghị uche,+Nghọta adịghịkwa n’etiti ha.+ 29  A sị nnọọ na ha maara ihe,+ ha gaara echebara ihe a echiche!+Ha gaara eche echiche banyere ihe ga-emesị bụrụ ọgwụgwụ ha.+ 30  Olee otú otu onye pụrụ isi chụọ otu puku mmadụ ọsọ,Mmadụ abụọ achụọkwa puku mmadụ iri ọsọ?+Ọ gwụla ma Oké Nkume ha ò rere ha,+Jehova enyefeekwa ha n’aka ha. 31  N’ihi na oké nkume ha adịghị ka Oké Nkume anyị,+Ọbụna ndị iro anyị ga-ekweta nke a.+ 32  N’ihi na osisi vaịn ha si n’osisi vaịn Sọdọm,O si na mbara ala Gọmọra.+Mkpụrụ vaịn ha bụ mkpụrụ vaịn na-egbu mmadụ,Ụyọkọ ha na-elu ilu.+ 33  Mmanya ha bụ elò nnukwu agwọ,Bụrụkwa nsí jọgburu onwe ya nke agwọ ubí.+ 34  Ọ́ bụghị n’ebe m nọ ka a kwakọbara ya,Kaakwa ya akara n’ụlọ nkwakọba ihe m?+ 35  Ọ bụ m nwe ịbọ ọbọ na ịkwụ ụgwọ.+N’oge a kara aka, ụkwụ ha agaghị akwụsi ike n’ala,+N’ihi na ụbọchị ọdachi ha dị nso,+Ihe ndị a ga-eme ha na-abịakwa ọsọ ọsọ.’+ 36  N’ihi na Jehova ga-ekpe ndị ya ikpe,+Ọ ga-enwekwa mwute maka ndị ohu ya,+N’ihi na ọ ga-ahụ na ha enwekwaghị enyemaka,Naanị ihe e nwere bụ onye na-enweghị enyemaka na onye na-abaghị n’ihe. 37  Ọ ga-asịkwa, ‘Olee ebe chi ha nọ,+Oké nkume nke ha gbabara n’ime ya,+ 38  Ònye na-eribu abụba nke àjà ha,+Na-aṅụ mmanya àjà ihe ọṅụṅụ ha?+Ha bilie nyere unu aka.+Ha ghọọrọ unu ebe nzuzo.+ 39  Hụnụ na ọ bụ m bụ ya,+E nweghịkwa chi ọzọ ọ bụ mụ na ya.+M na-eme ka a nwụọ, m na-emekwa ka a dị ndụ.+Emewo m ka e nwee oké mmerụ ahụ́,+ mụ onwe m ga-agwọkwa ya,+Ọ dịghịkwa onye na-anapụta ihe n’aka m.+ 40  N’ihi na m na-eweli aka m n’eluigwe ṅụọ iyi,+M na-asịkwa: “Dị nnọọ ka m dị ndụ ruo mgbe ebighị ebi,”+ 41  Mgbe m ga-amụ mma agha m nke na-egbu maramara,+Mgbe aka m ga-eme ihe e kpere n’ikpe,+M ga-abọ ọbọ n’ahụ́ ndị na-emegide m,+M ga-akwụkwa ndị kpọrọ m oké asị ụgwọ.+ 42  M ga-eme ka ọbara gbuo akụ́ m dị ka mmanya,+Mma agha m ga-erikwa anụ ahụ́,+Ṅụọkwa ọbara ndị e gburu egbu na nke ndị a dọtara n’agha,Ọ ga-erikwa isi ndị ndú nke onye iro.’+ 43  Soronụ ndị ya ṅụrịa ọṅụ, unu mba niile,+N’ihi na ọ ga-abọ ọbọ ọbara ndị ohu ya,+Ọ ga-abọ ọbọ n’ahụ́ ndị iro ya,+Kpuchiekwara ala nke ndị ya mmehie.” 44  Mozis wee bịa kwuo okwu niile nke abụ a ná ntị ụmụ Izrel,+ ya na Hoshia nwa Nọn.+ 45  Mgbe Mozis gwasịrị Izrel dum ihe a niile, 46  ọ gara n’ihu ịsị ha: “Tinyenụ okwu niile m na-agwa unu iji dọọ unu aka ná ntị taa n’obi unu,+ ka unu wee nye ụmụ unu iwu ka ha lezie anya ime ihe niile e kwuru n’iwu a.+ 47  N’ihi na ọ bụghịrị unu okwu na-abaghị uru,+ kama ọ bụ ndụ unu,+ unu ga-esitekwa n’okwu a mee ka ụbọchị unu dị ogologo n’ala ahụ unu na-agafe Jọdan inweta.”+ 48  Jehova wee gwa Mozis okwu n’otu ụbọchị ahụ, sị: 49  “Gbagoo n’ugwu Abarim a,+ bụ́ Ugwu Nibo,+ nke dị n’ala Moab, nke chere ihu na Jeriko, hụ ala Kenan, nke m na-enye ụmụ Izrel ịbụ ihe onwunwe.+ 50  Nwụọ n’elu ugwu ahụ ị na-agbago, ka e lie gị dị ka e liri ndị gị,+ dị nnọọ ka Erọn nwanne gị nwụrụ n’Ugwu Họọ,+ e wee lie ya dị ka e liri ndị ya; 51  n’ihi na unu emesoghị m otú unu kwesịrị isi meso m+ n’etiti ụmụ Izrel, na mmiri Meriba+ nke Kedesh, n’ala ịkpa Zin; n’ihi na unu edoghị m nsọ n’etiti ụmụ Izrel.+ 52  N’ihi na ị ga-anọ n’ebe dị anya hụ ala ahụ, ma ị gaghị abanye ebe ahụ, n’ala ahụ m na-enye ụmụ Izrel.”+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji