Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Diuterọnọmi 31:1-30

31  Mozis wee gaa gwa Izrel dum okwu ndị a,  wee sị ha: “Adị m otu narị afọ na iri abụọ taa.+ A gakwaghị ekwe ka m na-apụ apụ ma na-abata abata,+ dị ka Jehova gwara m, sị, ‘Ị gaghị agafe Jọdan a.’+  Ọ bụ Jehova bụ́ Chineke gị na-ebutere gị ụzọ ka ị na-agafe.+ Ya onwe ya ga-ala mba ndị a n’iyi n’ihu gị, ị ga-achụpụkwa ha.+ Ọ bụ Jọshụa ga-ebutere gị ụzọ ka ị na-agafe,+ dị nnọọ ka Jehova kwuru.  Jehova ga-emekwa ha ihe o mere Saịhọn+ na Ọg,+ bụ́ ndị eze ndị Amọraịt, meekwa ala ha, mgbe ọ lara ha n’iyi.+  Jehova enyefewokwa ha n’aka unu,+ unu ga-emekwa ha ihe dum m nyere unu n’iwu.+  Nweenụ obi ike, dịkwanụ ike.+ Atụla egwu, amakwala jijiji n’ihu ha,+ n’ihi na ọ bụ Jehova bụ́ Chineke gị ka gị na ya so na-aga. Ọ gaghị agbahapụ gị, ọ gaghịkwa ahapụ gị ma ọlị.”+  Mozis wee kpọọ Jọshụa ma gwa ya n’ihu Izrel dum, sị: “Nwee obi ike, dịkwa ike,+ n’ihi na ọ bụ gị ga-akpọba ndị a n’ala ahụ Jehova ṅụụrụ ndị nna nna ha iyi inye ha, ọ bụkwa gị ga-enye ha ya dị ka ihe nketa.+  Ọ bụ Jehova na-eje ije n’ihu gị. Ya onwe ya ga-anọnyere gị.+ Ọ gaghị agbahapụ gị, ọ gaghịkwa ahapụ gị ma ọlị. Atụla egwu, atụkwala ụjọ.”+  Mozis wee dee iwu+ a n’akwụkwọ ma nye ya ndị nchụàjà bụ́ ụmụ Livaị,+ ndị na-ebu igbe ọgbụgba ndụ Jehova,+ nyekwa ya ndị okenye niile nke Izrel. 10  Mozis wee nye ha iwu, sị: “Ná ngwụsị afọ asaa ọ bụla, n’oge a kara aka n’afọ, ị ga-akagbu ụgwọ e ji gị,+ n’ememme ụlọ ndò,+ 11  mgbe Izrel dum ga-abịa ịhụ ihu Jehova+ bụ́ Chineke gị n’ebe ọ ga-ahọrọ,+ ị ga-agụ iwu a n’ihu Izrel dum, ná ntị ha.+ 12  Kpọkọta ụmụ Izrel,+ ndị ikom na ndị inyom na ụmụntakịrị na onye mbịarambịa nke nọ n’ime obodo gị, ka ha wee gee ntị, ka ha mụtakwa ihe,+ ka ha tụọ egwu Jehova bụ́ Chineke unu+ ma lezie anya idebe ihe niile e kwuru n’iwu a. 13  Ụmụ ha ndị na-amabeghị ihe ndị a ga-ege ntị,+ ha ga-amụtakwa ịtụ egwu Jehova bụ́ Chineke unu ụbọchị niile unu na-adị ndụ n’ala ahụ unu na-agafe Jọdan inweta.”+ 14  E mesịa, Jehova gwara Mozis, sị: “Lee! Ụbọchị ị ga-anwụ adịwo nso.+ Kpọọ Jọshụa, guzorokwanụ n’ụlọikwuu nzute, ka m mee ya onye ndú.”+ Mozis na Jọshụa wee gaa guzoro n’ụlọikwuu nzute.+ 15  Jehova wee pụta ìhè n’ụlọikwuu ahụ n’ogidi ígwé ojii, ogidi ígwé ojii ahụ wee kwụrụ n’akụkụ ọnụ ụzọ ụlọikwuu ahụ.+ 16  Jehova wee gwa Mozis, sị: “Lee! Ị ga-esoro nna nna gị hà dinaa;+ ndị a ga-ebilikwa,+ ha na chi ọzọ ndị dị n’etiti ha, n’ala ahụ ha na-aga,+ ga-enwe mmekọahụ rụrụ arụ, ha ga-ahapụkwa m+ ma mebie ọgbụgba ndụ m nke mụ na ha gbara.+ 17  N’ihi nke ahụ, m ga-eweso ha iwe dị ọkụ n’ụbọchị ahụ,+ m ga-agbahapụkwa ha+ ma wepụ ihu m n’ebe ha nọ,+ ha ga-aghọkwa ihe a ga-ala n’iyi; ọtụtụ ọdachi na ahụhụ ga-adakwasịkwa ha,+ ha ga-ekwukwa n’ụbọchị ahụ, sị, ‘Ọ́ bụghị n’ihi na Chineke anyị anọghị n’etiti anyị mere ọdachi ndị a ji dakwasị anyị?’+ 18  Mụ onwe m ga-ewepụ ihu m n’ụbọchị ahụ n’ihi ihe ọjọọ niile ha mere, n’ihi na ha agakwuruwo chi ọzọ dị iche iche.+ 19  “Ugbu a, deerenụ onwe unu abụ a n’akwụkwọ,+ kụziekwara ya ụmụ Izrel.+ Mee ka ọ dịrị n’ọnụ ha, ka abụ a wee ghọọrọ m ihe akaebe megide ụmụ Izrel.+ 20  N’ihi na m ga-eduba ha n’ala ahụ m ṅụụrụ ndị nna nna ha iyi inye ha,+ nke mmiri ara ehi na mmanụ aṅụ na-eru na ya,+ ha ga-erikwa ihe+ wee rijuo afọ ma maa abụba+ wee gakwuru chi ọzọ dị iche iche,+ ha ga-efekwa ha ofufe ma lelịa m, mebiekwa ọgbụgba ndụ m.+ 21  Ọ ga-erukwa na mgbe ọtụtụ ọdachi na ahụhụ ga-adakwasị ha,+ abụ a ga-aza n’ihu ha dị ka onye akaebe, n’ihi na a gaghị echefu ya echefu n’ọnụ ụmụ ha, n’ihi na amaara m nke ọma ọchịchọ ha+ malitere inwe taa tupu mụ akpọba ha n’ala ahụ m ṅụrụ iyi inye ha.” 22  Mozis wee dee abụ a n’akwụkwọ n’ụbọchị ahụ, ka o wee kụziere ya ụmụ Izrel.+ 23  O wee mee Jọshụa nwa Nọn+ onye ndú, wee sị: “Nwee obi ike, dịkwa ike,+ n’ihi na ọ bụ gị ga-akpọba ụmụ Izrel n’ala ahụ m ṅụụrụ ha iyi inye ha,+ mụ onwe m ga-anọnyekwara gị.” 24  O wee ruo na ozugbo Mozis dechara iwu ndị a n’akwụkwọ ruo mgbe ha gwụchara,+ 25  Mozis malitere inye ndị Livaị, bụ́ ndị na-ebu igbe ọgbụgba ndụ Jehova,+ iwu, sị: 26  “Werenụ akwụkwọ iwu a,+ debenụ ya n’akụkụ igbe+ ọgbụgba ndụ Jehova bụ́ Chineke unu, ọ ga-aghọkwa ihe akaebe n’ebe ahụ megide gị.+ 27  N’ihi na mụ onwe m maara nke ọma banyere nnupụisi+ gị na ikwesi olu ike gị.+ Ọ bụrụ na mgbe m ka nọ ndụ ma nọrọ n’etiti unu taa, unu anọwo na-enupụrụ Jehova isi site n’àgwà unu na-akpaso ya,+ lezienụ ihe ga-eme mgbe m nwụsịrị! 28  Kpọkọtaranụ m ndị okenye niile nke ebo unu na ndị isi unu,+ ka m kwuo okwu ndị a ná ntị ha, ka eluigwe na ụwa wee bụrụ ndị akaebe m megide ha.+ 29  N’ihi na m maara nke ọma na mgbe m nwụsịrị, unu ga-emerịrị omume na-eweta mbibi,+ unu ga-ahapụkwa ụzọ ahụ m nyere unu iwu ka unu soro; ọdachi+ ga-adakwasịkwa unu ná ngwụsị ụbọchị ndị ahụ, n’ihi na unu ga-eme ihe jọrọ njọ n’anya Jehova iji kpasuo ya iwe site n’ihe aka unu ga-arụ.”+ 30  Mozis wee kwuo okwu dị n’abụ a ná ntị ọgbakọ Izrel dum, ruo mgbe o kwusịrị ya, ọ sịrị:+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji