Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet | BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Diuterọnọmi 30:1-20

30  “Ọ ga-erukwa na mgbe okwu a niile ga-emezu n’isi gị, bụ́ ngọzi+ na nkọcha+ m debere n’ihu gị, mgbe ị nọ ná mba niile Jehova bụ́ Chineke gị chụgara+ gị cheta ha,+  i wee jiri obi gị dum na mkpụrụ obi gị dum+ lọghachikwute Jehova bụ́ Chineke gị+ ma gee ntị n’olu ya dị ka ihe niile m na-enye gị na ụmụ gị n’iwu taa si dị,  Jehova bụ́ Chineke gị ga-akpọghachite ndị gị a dọọrọ n’agha+ wee meere gị ebere+ ma si n’etiti ndị niile Jehova bụ́ Chineke gị chụsasịrị gị kpọghachite gị.+  Ọ bụrụ na ndị gị a chụsasịrị achụsasị anọrọ na nsọtụ eluigwe, Jehova bụ́ Chineke gị ga-esi n’ebe ahụ chịkọta gị, sikwa n’ebe ahụ kpọrọ gị.+  Jehova bụ́ Chineke gị ga-akpọbata gị n’ala ahụ nna gị hà nwetara, ị ga-enwetakwa ya; ọ ga-emekwara gị ihe ọma ma mee ka ị mụbaa karịa nna gị hà.+  Jehova bụ́ Chineke gị ga-ebikwa obi+ gị na obi ụmụ gị úgwù,+ ka i wee jiri obi gị dum na mkpụrụ obi gị dum hụ Jehova bụ́ Chineke gị n’anya maka ndụ gị.+  Jehova bụ́ Chineke gị ga-emekwa ka ọbụbụ ọnụ a niile mezuo n’isi ndị iro gị nakwa n’isi ndị kpọrọ gị asị, bụ́ ndị kpagburu gị.+  “Gị onwe gị ga-atụgharị gee ntị n’olu Jehova ma debe iwu ya niile m na-enye gị taa.+  Jehova bụ́ Chineke gị ga-emekwa ka i nwee ọbụna karịa ihe ga-ezuru gị n’ihe niile aka gị na-arụ,+ ná mkpụrụ nke afọ gị na ụmụ anụ ụlọ+ gị na ihe ala gị na-emepụta,+ nke ga-eme ka i nwee ihe n’ụba;+ n’ihi na Jehova ga-enwe aṅụrị n’ihi gị wee meere gị ihe ọma, dị nnọọ ka o nwere aṅụrị n’ihi nna nna gị hà;+ 10  n’ihi na ị ga-ege ntị n’olu Jehova bụ́ Chineke gị iji debe ihe o nyere n’iwu na ụkpụrụ ya ndị e dere n’akwụkwọ iwu a,+ n’ihi na ị ga-eji obi gị dum na mkpụrụ obi gị dum lọghachikwute Jehova bụ́ Chineke gị.+ 11  “N’ihi na iwu a m na-enye gị taa esighịrị gị oké ike, ọ dịghịkwa n’ebe dị anya.+ 12  Ọ dịghị n’eluigwe, nke ga-eme ka ị sị, ‘Ònye ga-arịgoro anyị n’eluigwe wetara anyị ya, ka o wee mee ka anyị nụ ya wee mee ya?’+ 13  Ọ dịghịkwa n’ofe oké osimiri, nke ga-eme ka ị sị, ‘Ònye ga-agara anyị n’ofe oké osimiri wetara anyị ya, ka o wee mee ka anyị nụ ya wee mee ya?’ 14  N’ihi na okwu ahụ dị gị nnọọ nso, n’ọnụ gị nakwa n’obi gị,+ ka i wee mee ya.+ 15  “Lee, ana m edebe n’ihu gị taa ndụ na ihe ọma, nakwa ọnwụ na ihe ọjọọ.+ 16  Ọ bụrụ na i gee ntị n’iwu Jehova bụ́ Chineke gị, nke m na-enye gị taa, ka ị hụ Jehova bụ́ Chineke gị n’anya,+ jee ije n’ụzọ ya ma debe ihe o nyere n’iwu+ na ụkpụrụ ya nakwa mkpebi ikpe ya,+ ị ga-adị ndụ+ ma mụbaa, Jehova bụ́ Chineke gị ga-agọzikwa gị n’ala ahụ ị na-aga inweta.+ 17  “Ma ọ bụrụ na obi gị atụgharịa, i wee ghara ige ntị,+ e wee rafuo gị, i wee kpọọrọ chi ọzọ dị iche iche isiala, feekwa ha ofufe,+ 18  ana m agwa unu taa na unu ga-alarịrị n’iyi.+ Ụbọchị unu agaghị adị ogologo n’ala ahụ unu na-agafe Jọdan ịga nweta. 19  Eluigwe na ụwa bụ ndị akaebe m megide unu taa,+ na edebewo m ndụ na ọnwụ n’ihu unu,+ ngọzi+ na nkọcha;+ ị ga-ahọrọkwa ndụ ka i wee dịrị ndụ,+ gị na ụmụ gị,+ 20  site n’ịhụ Jehova bụ́ Chineke gị n’anya,+ site n’ige ntị n’olu ya na site n’ịrapara ya n’ahụ́;+ n’ihi na ya onwe ya bụ ndụ gị, bụrụkwa ogologo ụbọchị gị,+ ka i wee biri n’ala ahụ Jehova ṅụụrụ nna nna gị hà bụ́ Ebreham, Aịzik na Jekọb iyi inye ha.”+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji