Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Diuterọnọmi 25:1-19

25  “Ọ bụrụ na mmadụ abụọ esee okwu,+ ha ewee bịa ka e kpeere ha ikpe,+ a ga-ekpere ha ikpe ma kwuo na onye ezi omume bụ onye ezi omume, kwuokwa na onye ajọ omume bụ onye ajọ omume.+  Ọ ga-erukwa na ọ bụrụ na e kwesịrị ka a pịa onye ajọ omume ihe,+ onyeikpe ahụ ga-emekwa ka o dinara ala gbatịa onwe ya, a ga-anọkwa n’ihu ya pịa onye ahụ ọnụ ụtarị ole+ e kwesịrị ịpịa ya n’ihi ihe ọjọọ o mere.  Ọ pụrụ ịpịa ya ọnụ ụtarị iri anọ. Ọ dịghị ihe ọ ga-atụkwasị ya, ka ọ ghara ịnọ na-apịa ya ọtụtụ ọnụ ụtarị karịa nke a,+ e wee menye nwanne gị ihere n’anya gị.  “Ekechila ọnụ ehi mgbe ọ na-azọcha mkpụrụ.+  “Ọ bụrụ na ụmụnne bikọta ọnụ, otu n’ime ha anwụọ n’enweghị nwa nwoke, nwunye onye ahụ nwụrụ anwụ agaghị abụ nwunye nwoke ọzọ n’èzí. Nwanne di ya ga-agakwuru ya, ọ ga-akpọrọkwa ya ka ọ bụrụ nwunye ya wee kuchie ya.+  Ọ ga-erukwa na nwa mbụ nwaanyị ahụ ga-amụ ga-aza aha nwanne ya nwoke nwụrụ anwụ,+ ka e wee ghara ihichapụ aha ya n’Izrel.+  “Ma ọ bụrụ na nwoke ahụ enweghị mmasị ịkpọrọ nwunye nwanne ya nwụrụ anwụ, nwunye nwanne ya ahụ nwụrụ anwụ ga-agakwuru ndị okenye+ n’ọnụ ụzọ ámá wee sị, ‘Nwanne di m ajụwo ime ka aha nwanne ya nwoke dịgide n’Izrel. O kweghị ekuchi m.’  Ndị okenye obodo ya ga-akpọ nwoke ahụ wee gwa ya okwu, ọ ga-eguzokwa wee sị, ‘Enweghị m mmasị ịkpọrọ ya.’+  Mgbe o kwuru nke ahụ, nwunye nwanne ya nwụrụ anwụ ga-abịakwute ya n’ihu ndị okenye ahụ wee yipụ otu akpụkpọ ụkwụ+ ya ma gbụọ ya ọnụ mmiri n’ihu,+ zaakwa, sị, ‘Otú a ka a ga-eme nwoke nke na-ekweghị ewulite ezinụlọ nwanne ya nwoke.’+ 10  A ga-akpọkwa aha ya n’Izrel ‘Ụlọ onye e yipụrụ akpụkpọ ụkwụ ya.’ 11  “Ọ bụrụ na ndị ikom abụọ na-alụ ọgụ, nwunye otu n’ime ha ewee bịaruo nso ịnapụta di ya n’aka onye na-eti ya ihe, o wee setịa aka nwụchie ya n’ihe o ji bụrụ nwoke,+ 12  ị ga-egbupụ ya aka. Anya gị agaghị eme ebere.+ 13  “Enwela ụdị ihe ọ̀tụ̀tụ̀ abụọ n’akpa gị,+ nke ukwu na nke nta. 14  Enwela ụdị ihe ọ̀tụ̀tụ̀ efa abụọ n’ụlọ gị,+ nke ukwu na nke nta. 15  Ị ga-enwe naanị ihe ọ̀tụ̀tụ̀ ziri ezi ma zuo ezu. Ọ bụ naanị ihe ọ̀tụ̀tụ̀ efa ziri ezi ma zuo ezu ka ị ga-enwe, ka ụbọchị gị wee dị ogologo n’ala ahụ Jehova bụ́ Chineke gị na-enye gị.+ 16  N’ihi na onye ọ bụla nke na-eme ihe ndị a, onye ọ bụla nke na-ekpe ikpe na-ezighị ezi, bụ ihe arụ n’anya Jehova bụ́ Chineke gị.+ 17  “Ị ga-echeta ihe Amalek mere gị n’ụzọ, mgbe unu si n’Ijipt na-apụta,+ 18  otú o si zute gị n’ụzọ wee gbuo ndị niile na-adịghị agasi ike bụ́ ndị nọ n’azụ azụ gị, mgbe ike gwụrụ gị, i wee daa mbà; ọ tụghịkwa egwu Chineke.+ 19  Ọ ga-erukwa na mgbe Jehova bụ́ Chineke gị mere ka i zuoro ndị iro niile gbara gị gburugburu ike n’ala ahụ Jehova bụ́ Chineke gị na-enye gị ka ọ bụrụ nke gị dị ka ihe nketa,+ ị ga-ekpochapụ Amalek ka a ghara ịkpọtụkwa ha aha n’okpuru eluigwe.+ Echefula.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji