Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet | BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Diuterọnọmi 11:1-32

11  “Hụ Jehova bụ́ Chineke gị n’anya,+ rubere ya isi, debekwa ụkpụrụ ya na mkpebi ikpe+ ya na iwu ya mgbe niile.  Unu makwaara nke ọma taa (n’ihi na ọ bụghị ụmụ unu ka m na-agwa okwu, bụ́ ndị na-amaghị, ndị na-ahụghịkwa ịdọ aka ná ntị Jehova+ bụ́ Chineke unu, ịdị ukwuu+ ya, aka ya dị ike+ na ogwe aka ọ gbatịrị agbatị,+  ma ọ bụ, ihe ịrịba ama ya na ihe ndị o mere n’ime Ijipt,+ bụ́ ihe ndị o mere Fero eze Ijipt na ala ya dum;  ma ọ bụ, ihe o mere ndị agha Ijipt, ihe o mere ịnyịnya ya na ụgbọ ịnyịnya agha ya bụ́ ndị o mere ka mmiri Oké Osimiri Uhie rie mgbe ha nọ na-achụ ha ọsọ,+ Jehova wee bibie ha ruo taa;+  ma ọ bụ, ihe o mere unu n’ala ịkpa ruo mgbe unu bịarutere ebe a;  ma ọ bụ, ihe o mere Detan na Abaịram+ bụ́ ụmụ Elayab nwa Ruben, mgbe ala meghere ọnụ ya wee loda ha na ezinụlọ ha na ụlọikwuu ha nakwa ihe ọ bụla dị ndụ nke sonyeere ha n’etiti ndị Izrel niile);+  n’ihi na unu ji anya unu hụ oké ihe niile Jehova mere.+  “Debekwanụ iwu+ dum m na-enye gị taa, ka unu wee dị ike ma banye nweta ala ahụ unu na-agafe inweta,+  nakwa ka ụbọchị unu wee dị ogologo+ n’ala ahụ Jehova ṅụụrụ nna nna unu hà iyi inye ha na mkpụrụ ha,+ ala mmiri ara ehi na mmanụ aṅụ na-eru na ya.+ 10  “N’ihi na ala ahụ ị na-aga inweta adịghị ka ala Ijipt unu si pụta, bụ́ ebe ị na-agha mkpụrụ gị ma jiri ụkwụ gị gaa na-agba ya mmiri, dị ka ubi akwụkwọ nri. 11  Kama ala unu na-agafe inweta bụ ala ugwu na ala ndagwurugwu.*+ Mmiri nke si n’eluigwe na-ede ya; 12  ala nke Jehova bụ́ Chineke gị na-elekọta. Anya+ Jehova bụ́ Chineke gị dị na ya mgbe niile, site ná mmalite afọ ruo ná ngwụsị afọ. 13  “Ọ ga-erukwa na ọ bụrụ na unu erube nnọọ isi n’iwu+ m bụ́ ndị m na-enye unu taa wee hụ Jehova bụ́ Chineke unu n’anya ma jiri obi unu dum na mkpụrụ obi unu dum na-ejere ya ozi,+ 14  m ga-eme ka mmiri zoo n’ala unu n’oge ya,+ ụbịa mmiri na ụla mmiri,+ ị ga-ewebatakwa ọka* gị, mmanya gị dị ụtọ na mmanụ gị. 15  M ga-emekwa ka e nwee ahịhịa ndụ n’ala gị maka anụ ụlọ gị,+ ị ga-erikwa ihe wee rijuo afọ.+ 16  Lezienụ anya ka a ghara ịrata obi unu,+ unu ewee gaa fee chi ọzọ ma kpọọrọ ha isiala,+ 17  Jehova ewee weso unu iwe dị ọkụ, o wee mechie eluigwe ka mmiri ghara izo,+ ala agaghịkwa emepụta ihe, unu ewee laa n’iyi ọsọ ọsọ pụọ n’ezi ala ahụ Jehova na-enye unu.+ 18  “Tinyenụ okwu m ndị a n’obi unu+ nakwa ná mkpụrụ obi unu, keekwa ha n’aka unu dị ka ihe ịrịba ama, ha ga-abụkwa ihe unu ga na-ekegide n’egedege ihu unu, n’agbata anya abụọ unu.+ 19  Kụziekwaranụ ha ụmụ unu, ka i wee kwuo okwu banyere ha mgbe ị nọ ọdụ n’ụlọ gị na mgbe ị na-eje ije n’okporo ụzọ na mgbe i dina ala nakwa mgbe i biliri ọtọ.+ 20  Deekwa ha n’awara ụzọ ụlọ gị nakwa n’ọnụ ụzọ ámá gị,+ 21  ka ụbọchị unu na ụbọchị ụmụ unu wee dị ọtụtụ+ n’ala ahụ Jehova ṅụụrụ nna nna unu hà iyi inye ha,+ ruo ụbọchị niile ụwa dị n’okpuru eluigwe.+ 22  “N’ihi na ọ bụrụ na unu edebezuo iwu+ a dum m na-enye unu wee mee ya, wee hụ Jehova bụ́ Chineke unu n’anya,+ wee jee ije n’ụzọ ya niile,+ raparakwa ya n’ahụ́,+ 23  Jehova ga-achụpụkwa mba ndị a niile n’ihi unu,+ unu ga-anapụkwa mba ndị dị ukwuu ma dị ike karịa unu ala ha.+ 24  Ebe ọ bụla ọbụ ụkwụ unu ga-azọ ga-abụ nke unu.+ Ókè nke ala unu ga-amalite n’ala ịkpa ruo Lebanọn, malite n’Osimiri, bụ́ Osimiri Yufretis, ruo n’oké osimiri dị n’ebe ọdịda anyanwụ.+ 25  Ọ dịghị onye ga-eguzosi ike n’ihu unu.+ Jehova bụ́ Chineke unu ga-eme ka ụjọ unu na egwu unu jide ndị bi n’ala+ dum unu ga-azọ ụkwụ na ya, dị nnọọ ka o kwere unu ná nkwa. 26  “Lee, ana m edebe n’ihu unu taa ngọzi na nkọcha:+ 27  ngọzi, ma ọ bụrụhaala na unu erube isi n’iwu Jehova bụ́ Chineke unu,+ bụ́ ndị m na-enye unu taa; 28  nakwa nkọcha,+ ma ọ bụrụ na unu erubeghị isi n’ihe Jehova bụ́ Chineke unu nyere n’iwu,+ unu ewee hapụ ụzọ m na-enye unu iwu taa ka unu soro, wee soro chi ọzọ ndị unu na-amaghị. 29  “Ọ ga-erukwa na mgbe Jehova bụ́ Chineke gị ga-akpọbata gị n’ala ahụ ị na-aga inweta,+ ị ga-ekwupụtakwa ngọzi n’elu Ugwu Gerizim+ nakwa nkọcha n’elu Ugwu Ibal.+ 30  Ọ̀ bụ na ha adịghị n’akụkụ Jọdan, n’ebe ọdịda anyanwụ, n’ala ndị Kenan bụ́ ndị bi n’Araba,+ n’ihu Gilgal,+ n’akụkụ osisi ukwu nke More?+ 31  N’ihi na unu na-agafe Jọdan ịbanye nweta ala ahụ Jehova bụ́ Chineke unu na-enye unu, unu ga-enwetakwa ya wee biri n’ime ya.+ 32  Lezienụ anya ka unu debe ụkpụrụ na mkpebi ikpe+ niile m na-enye unu taa.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Otú e si dee ya n’asụsụ Hibru bụ “mbara ala nke dị na ndagwurugwu.”
Ọka a na-ekwu okwu ya ebe a bụ ụdị dị ka ọka wit na ọka bali.