Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet | BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Diuterọnọmi 10:1-22

10  “Jehova wee gwa m n’oge ahụ, sị, ‘Wapụtara onwe gị mbadamba nkume abụọ ndị dị ka ndị mbụ ahụ,+ gbagokwute m n’ugwu, jirikwa osisi rụọrọ onwe gị igbe.+  M ga-edekwa ná mbadamba nkume ndị ahụ okwu ndị dị ná mbadamba nkume ndị mbụ ahụ ị kụriri, ị ga-etinyekwa ha n’igbe ahụ.’  M wee jiri osisi akeshịa rụọ igbe ma wapụta mbadamba nkume abụọ ndị dị ka ndị mbụ ahụ,+ m wee gbagoo n’ugwu ahụ, m bukwa mbadamba nkume abụọ ahụ n’aka.  O wee dee ná mbadamba nkume ndị ahụ ihe ahụ o dere ná ndị mbụ ahụ,+ bụ́ Okwu Iri ahụ,+ bụ́ ihe Jehova si n’etiti ọkụ+ gwa unu n’ugwu ahụ n’ụbọchị unu zukọtara;+ e mesịa, Jehova bunyere m ha.  M wee tụgharịa si n’ugwu+ ahụ gbadata ma tinye mbadamba nkume ndị ahụ n’igbe ahụ m rụrụ, ka ha wee dịrị n’ebe ahụ, dị nnọọ ka Jehova nyere m n’iwu.+  “Ụmụ Izrel wee si Bierọt Bene-jeekan+ kwalie gawa Mosira. N’ebe ahụ ka Erọn nwụrụ, e wee lie ya n’ebe ahụ;+ Elieza nwa ya nwoke wee malite ije ozi n’ọnọdụ ya dị ka onye nchụàjà.+  Ha wee si n’ebe ahụ kwalie gawa Gọdgọda, sikwa na Gọdgọda gawa Jọtbata,+ bụ́ ala iyi ndagwurugwu nke mmiri na-asọ na ya.  “N’oge ahụ, Jehova kewapụrụ ebo Livaị+ iche maka ibu igbe ọgbụgba ndụ Jehova,+ ka ha na-eguzo n’ihu Jehova maka ijere ya ozi+ na iji aha ya na-enye ngọzi ruo taa.+  Ọ bụ ya mere na ọ dịghị òkè na ihe nketa Livaị nwere+ n’etiti ụmụnne ya. Jehova bụ ihe nketa ya, dị nnọọ ka Jehova bụ́ Chineke gị gwara ya.+ 10  Ma mụ onwe m nọrọ n’ugwu ahụ dị ka m nọrọ n’ụbọchị ndị mbụ, ya bụ, ụbọchị iri anọ, ehihie na abalị,+ Jehova wee gee m ntị n’oge ahụkwa.+ Jehova achọghị ibibi unu.+ 11  Jehova wee sị m, ‘Bilie, butere ndị a ụzọ ka ha wee kwalie, ka ha wee banye ma nweta ala ahụ m ṅụụrụ ndị nna nna ha iyi inye ha.’+ 12  “Ugbu a, Izrel, gịnị ka Jehova bụ́ Chineke gị na-achọ n’aka gị+ ma ọ́ bụghị ịtụ egwu+ Jehova bụ́ Chineke gị, ka i wee jee ije n’ụzọ ya niile+ nakwa ka ị hụ ya n’anya+ ma jiri obi gị dum na mkpụrụ obi gị dum na-ejere Jehova bụ́ Chineke gị ozi;+ 13  ka i debe iwu Jehova na ụkpụrụ+ ya ndị m na-enye gị taa, maka ọdịmma gị?+ 14  Lee, ọ bụ Jehova bụ́ Chineke gị nwe eluigwe,+ bụ́ eluigwe nke eluigwe, ụwa+ na ihe niile dị n’ime ya. 15  Ọ bụ naanị na Jehova nwere mmasị n’ebe nna nna gị hà nọ ka o wee hụ ha n’anya, ọ bụ ya mere o ji họrọ ụmụ ha ndị nọchiri ha,+ ya bụ, unu, n’etiti ndị niile, dị ka ọ dị taa. 16  Biekwanụ obi unu úgwù,+ unu ekwesikwala olu ike ọzọ.+ 17  N’ihi na Jehova bụ́ Chineke unu bụ Chi kasị chi niile+ na Onyenwenụ kasị ndị nwenụ niile,+ Chineke ukwu, onye dị ike ma dị egwu,+ onye na-adịghị ele onye ọ bụla anya n’ihu,+ ọ dịghịkwa eri ngarị,+ 18  ọ na-ekpere nwa na-enweghị nna na nwaanyị di ya nwụrụ ikpe,+ na-ahụkwa onye mbịarambịa n’anya+ ka o wee nye ya nri na ákwà mgbokwasị. 19  Unu onwe unu ga-ahụkwa onye mbịarambịa n’anya,+ n’ihi na unu ghọrọ ndị mbịarambịa n’ala Ijipt.+ 20  “Ọ bụ Jehova bụ́ Chineke gị ka ị ga-atụ egwu.+ Ọ bụ ya ka ị ga-ejere ozi,+ n’ahụ́ ya ka ị ga-araparakwa,+ ọ bụkwa aha ya ka ị ga-eji ṅụọ iyi.+ 21  Ọ bụ ya ka ị ga-enye otuto,+ ọ bụkwa Chineke gị, onye meere gị oké ihe ndị a dị egwu bụ́ ndị anya gị hụrụ.+ 22  Mkpụrụ obi iri asaa so nna nna gị hà gbadaa Ijipt,+ ma Jehova bụ́ Chineke gị emewo ka ị dị ọtụtụ dị ka kpakpando nke eluigwe.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji