Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Abụ Sọlọmọn 4:1-16

4  “Lee! Ị mara mma,+ enyi m nwaanyị. Lee! Ị mara mma. Anya gị bụ anya nduru+ n’ákwà i ji kpuchie ihu gị.+ Ntutu isi gị dị ka ìgwè ewu+ nke si n’ógbè Gilied bụ́ ugwu ugwu+ madata.  Ezé gị yiri ìgwè nne atụrụ+ a kpachara ajị ọhụrụ, ndị si n’ebe a sara ha ahụ́ na-apụta, ha niile na-amụ ejima ejima, ọ dịghịkwa nke ọ bụla n’ime ha ụmụ nwụnahụrụ.  Egbugbere ọnụ gị yiri eri uhie, ihe ị na-ekwu dịkwa ụtọ.+ Agba ntị gị abụọ, nke i kpuchiri ákwà,+ yiri mkpụrụ pọmigranet a pịwara abụọ.  Olu gị+ dị ka ụlọ elu+ Devid, nke e ji nkume e doro n’usoro wuo, nke e kokwasịrị otu puku ọta, bụ́ ọta niile dị okirikiri+ nke ndị dike.  Ara gị abụọ+ yiri ụmụ mgbada abụọ, bụ́ ejima nne mgbada mụrụ, ndị na-ata nri n’ebe okooko lili juru.”+  “Tupu oge ikuku ji eku eruo,+ onyinyo alaakwa, m ga-aga n’ugwu nke ihe na-esi ísì ụtọ bụ́ mea dị, gaakwa n’ugwu nke frankinsens dị.”+  “Ị mara ezigbo mma,+ enyi m nwaanyị, i nweghị ntụpọ.+  Nwaanyị m na-alụ ọhụrụ,+ ka mụ na gị si na Lebanọn+ pụọ, ka mụ na gị si na Lebanọn pụọ. Si n’elu ugwu Amana, n’elu ugwu Sina,+ ọbụna Hemọn,+ gbadaa, ka anyị si n’ọgba ọdụm nakwa n’ugwu agụ owuru gbadaa.  I mewo ka obi na-akụ m kpim kpim, nwanne m nwaanyị,+ nwaanyị m na-alụ ọhụrụ,+ otu anya i lere m+ na otu ihe ị kwụnyere n’ihe olu gị emewo ka obi na-akụ m kpim kpim. 10  Lee ka otú i si egosi ịhụnanya gị si dị mma,+ nwanne m nwaanyị, nwaanyị m na-alụ ọhụrụ! Lee ka otú i si egosi ịhụnanya si dị ụtọ karịa mmanya, ísì mmanụ gị dịkwa ụtọ karịa ụdị ihe otite niile na-esi ísì ụtọ!+ 11  Nwaanyị m na-alụ ọhụrụ, ihe si n’egbugbere ọnụ gị na-atasị bụ mmanụ aṅụ nke si n’ụgbụgbọ ya.+ Mmanụ aṅụ+ na mmiri ara ehi dị n’okpuru ire gị, ísì ụtọ nke uwe gị dịkwa ka ísì ụtọ+ Lebanọn. 12  Nwanne m nwaanyị+ bụ ubi a gbara ogige ma kpọchie, nwaanyị m na-alụ ọhụrụ bụ ubi a gbara ogige ma kpọchie, isi iyi e mechiri emechi. 13  Akpụkpọ ahụ́ gị bụ paradaịs nke osisi pọmigranet, nke nwere ọmarịcha mkpụrụ,+ okooko osisi hena na ahịhịa spaịknad;+ 14  ahịhịa spaịknad+ na okooko safrọn,+ ahịhịa na-esi ísì ụtọ+ na sinamọn,+ tinyere ụdị osisi niile nke frankinsens, mea na alo+ nakwa ụdị ọmarịcha ihe niile na-esi ísì ụtọ;+ 15  nweekwa isi iyi nke ubi a gbara ogige, olulu mmiri nke mmiri ya dị ọcha,+ nakwa iyi nke si Lebanọn+ na-asọ nwayọọ nwayọọ. 16  Ifufe nke si n’ebe ugwu, teta, ifufe nke si n’ebe ndịda,+ fere bịa. Fee n’ubi m a gbara ogige.+ Ka ísì ụtọ ya kusaa.” “Ka onye m hụrụ n’anya bata n’ubi ya a gbara ogige ma taa ọmarịcha mkpụrụ osisi ya.”

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji