Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet | BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Abụ Sọlọmọn 2:1-17

2  “Abụ m okooko safrọn+ nke puru n’ụsọ oké osimiri,+ bụrụkwa okooko lili nke puru na ndagwurugwu.”+  “Dị ka okooko lili nke puru n’etiti ahịhịa ogwu, otú ahụ ka enyi m nwaanyị dị n’etiti ụmụ nwaanyị.”+  “Dị ka osisi apụl+ nke dị n’etiti osisi ndị dị n’oké ọhịa, otú ahụ ka onye m hụrụ n’anya dị n’etiti ụmụ nwoke.+ Ndò ya agụsiwo m agụụ ike, ọ bụkwa n’ebe ahụ ka m nọdụrụ ala, mkpụrụ ya na-atọkwa okpo ọnụ m ụtọ.  Ọ kpọbatara m n’ụlọ mmanya,+ ọkọlọtọ+ ya nke na-efe n’elu isi m bụ ịhụnanya.+  Nyenụ m achịcha mkpụrụ vaịn+ ka m taa wee nwee ume, nyenụ m mkpụrụ osisi apụl ka m taa; n’ihi na ịhụnanya eriela m obi.+  M hiwere isi n’aka ekpe ya; o jikwa aka nri ya makụọ m.+  Ụmụ nwaanyị Jeruselem, ejiriwo m nne mgbada+ ma ọ bụ nne ele+ bi n’ọhịa mee ka unu ṅụọ iyi,+ ka unu ghara ịkpọte ịhụnanya dị n’ime m ma ọ bụ kpalie ya ruo mgbe ọ chọrọ.+  “Anụrụ m olu onye m hụrụ n’anya!+ Lee! Ọ bụ ya na-abịa,+ ọ na-arị ugwu ukwu, na-awụlikwa elu n’ugwu nta.  Onye m hụrụ n’anya yiri nne mgbada+ ma ọ bụ nwa oké ele. Lee! Ọ bụ ya guzo n’azụ mgbidi anyị, si na windo na-elebata anya, sikwa na mpio ụlọ na-enyobata anya.+ 10  Onye m hụrụ n’anya gwara m, sị, ‘Bilie, enyi m nwaanyị, asampete m,+ ka anyị pụọ.+ 11  N’ihi na, lee! oge udu mmiri agafewo,+ oké mmiri ozuzo akwụsịwokwa, ọ laala. 12  Okooko osisi awaala n’elu ala,+ oge e ji akwacha osisi vaịn+ eruwo, a nụwokwa ubé nduru+ n’ala anyị. 13  Osisi fig+ emewo ka mkpụrụ fig mbụ ya chaa;+ osisi vaịn amaala ifuru, ha na-esipụta ísì ụtọ ha. Bilie, bịa, enyi m nwaanyị,+ asampete m, ka anyị pụọ. 14  Nduru m,+ gosi m ihu gị+ n’ebe mgbaba nke dị na nkume dị elu, n’ebe zoro ezo n’ụzọ kpọdara akpọda n’ugwu, ka m nụkwa olu gị, n’ihi na olu gị dị ụtọ, ị makwara mma.’”+ 15  “Jiderenụ anyị nkịta ọhịa,+ bụ́ ụmụ nkịta ọhịa na-emebisị ubi vaịn, ebe ọ bụ na ubi vaịn anyị amawo ifuru.”+ 16  “Onye m hụrụ n’anya bụ nke m, abụkwa m nke ya.+ Ọ na-azụ atụrụ+ n’ebe okooko lili juru.+ 17  Tupu oge ikuku ji eku eruo, onyinyo alaakwa, tụgharịa, onye m hụrụ n’anya; dịrị ka nne mgbada+ ma ọ bụ nwa oké ele nke nọ n’elu ugwu nkewa.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji