Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet | BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Abụ Ọma 98:1-9

Abụ olu ụtọ. 98  Bụkuonụ Jehova abụ ọhụrụ,+N’ihi na ihe ndị o mere dị ebube.+Aka nri ya, ya bụ, ogwe aka ya nke dị nsọ, enwetaworo ya nzọpụta.+   Jehova emewo ka a mara nzọpụta ya;+O kpughewo ezi omume ya n’anya mba dị iche iche.+   O chetawo obiọma* ya na ikwesị ntụkwasị obi ya n’ebe ụlọ Izrel nọ.+Nsọtụ niile nke ụwa ahụwo nzọpụta si n’aka Chineke anyị.+   Tikuonụ Jehova mkpu mmeri, unu ndị niile bi n’ụwa.+Nweenụ obi ụtọ, tienụ mkpu ọṅụ, bụọkwanụ abụ olu ụtọ.+   Jirinụ ụbọ akwara bụkuo Jehova abụ olu ụtọ,+Jirinụ ụbọ akwara na abụ olu ụtọ bụkuo ya abụ.+   Jirinụ opi na ụda opi+Tie mkpu mmeri n’ihu Eze, bụ́ Jehova.   Ka oké osimiri bigbọọ, ya na ihe jupụtara n’ime ya,+Ma elu ala ma ndị bi n’ime ya.+   Ka osimiri kụọ aka;Ka ugwu niile tie mkpu ọṅụ+   N’ihu Jehova, n’ihi na ọ bịawo ikpe ụwa ikpe.+Ọ ga-ekpe elu ala ikpe n’ezi omume,+Kpeekwa ndị dị iche iche ikpe ziri ezi.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ, “ịhụnanya na-adịgide adịgide.”