Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet | BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Abụ Ọma 93:1-5

93  Jehova aghọwo eze!+O yi ịdị ukwuu dị ka uwe;+Jehova yi ike dị ka uwe—o kere ike n’úkwù ya.+Elu ala guzosikwara ike nke na a pụghị ime ka ọ maa jijiji.+   Ocheeze gị guzosiri ike site n’oge dị anya gara aga;+Ị dị adị site na mgbe ebighị ebi.+   Jehova, osimiri na-eme mkpọtụ,Osimiri emewo mkpọtụ;+Osimiri na-eme mkpọtụ na-ada ụda.+   Jehova, bụ́ onye nọ n’ebe dị elu, dị ebube+Karịa mkpọtụ nnukwu mmiri, karịa oké ebili mmiri dị ebube nke oké osimiri.+   Ihe ncheta gị bụ ihe a pụrụ nnọọ ịtụkwasị obi.+Jehova, ụlọ gị kwesịrị ịdị nsọ+ ruo ogologo ụbọchị niile.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji