Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet | BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Abụ Ọma 88:1-18

Abụ, abụ olu ụtọ ụmụ Kora. Ntụziaka e nyere onye nduzi nke Mehalat maka iji na-abụ abụ. Maskil nke Himan+ onye Zira. 88  Jehova, Chineke nke nzọpụta m,+Akwara m ákwá n’ehihie,+Kwaakwa ákwá n’abalị, n’ihu gị.+   Ekpere m ga-abịa n’ihu gị.+Tọọ ntị n’ala n’ákwá m na-ebesara gị.+   N’ihi na ọtụtụ ọdachi adakwasịwo mkpụrụ obi m,+Ndụ m abịaruwokwa ọbụna Shiol nso.+   A gụnyewo m ná ndị na-agbada n’olulu;+Adịzi m ka dimkpa nke ume na-adịkwaghị,+   Dị ka à ga-asị na m nọ n’etiti ndị nwụrụ anwụ, adị m ka onye nweere onwe ya,+Dị ka ndị e gburu egbu bụ́ ndị tọgbọrọ n’ili,+Ndị ị na-adịkwaghị echeta,Ndị na-adịkwaghị enweta enyemaka gị.+   Ị tụbawo m n’olulu miri emi nke ukwuu,N’ebe gbara ọchịchịrị, n’ime nnukwu abis.+   Ọnụma gị adakwasịwo m,+I jiriwokwa oké ebili mmiri gị niile mekpaa m ahụ́.+ Sila.   I mewo ka ndị mụ na ha ma nọrọ m n’ebe dị anya;+I mewo ka m bụụrụ ha oké ihe arụ.+E jichiri m ejichi, enweghị m ike ịpụ.+   Anya m adịkwaghị ahụcha ụzọ n’ihi mmekpa ahụ́ m.+Jehova, akpọkuwo m gị ogologo ụbọchị dum;+Agbasapụworo m gị ọbụ aka m.+ 10  Ọ̀ bụ ndị nwụrụ anwụ ka ị ga-emere ihe dị ịtụnanya?+Ka ndị na-adịghị ndụ hà ga-ebili,+Hà ga-eto gị?+ Sila. 11  À ga-akọ banyere obiọma* gị n’ili,Kọọkwa banyere ikwesị ntụkwasị obi gị n’ebe mbibi?+ 12  À ga-anọ n’ọchịchịrị mata ihe ịtụnanya ị na-eme,+Ka à ga-anọ n’ala nke ndị e chefuru echefu mata ezi omume gị?+ 13  Ma, ọ bụ gị, Jehova, ka mụ onwe m na-etiku maka enyemaka,+Ekpere m na-abịakwutekwa gị kwa ụtụtụ.+ 14  Jehova, gịnị mere i ji jụ mkpụrụ obi m?+Gịnị mere i ji ewepụ ihu gị n’ebe m nọ?+ 15  Malite n’oge m bụ nwata, anọ m n’ahụhụ, ọ fọkwara nke nta ka m kubie ume;+Ediwo m ọtụtụ ihe na-emenye ụjọ ndị si n’aka gị.+ 16  Iwe gị dị ọkụ agafewo m n’elu isi; +Oké ụjọ nke si n’ebe ị nọ emewo ka m dere duu.+ 17  Ha agbawo m gburugburu ogologo ụbọchị dum dị ka mmiri;+Ha niile agbawo m gburugburu n’otu mgbe ahụ. 18  I mewo ka ndị enyi m na ndị mụ na ha na-akpakọrịta nọrọ m n’ebe dị anya;+Ọ bụ ebe gbara ọchịchịrị ka mụ na ya ma.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ, “ịhụnanya na-adịgide adịgide.”