Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet | BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Abụ Ọma 85:1-13

Maka onye nduzi. Abụ ọma ụmụ Kora. Abụ olu ụtọ. 85  Jehova, ala gị na-eme gị obi ụtọ;+Ị kpọghachitewo ndị Jekọb a dọọrọ n’agha.+   Ị gbagharawo njehie nke ndị gị;+I kpuchiwo mmehie ha dum.+ Sila.   Ị chịkwawo iwe gị dum;+Ị kwụsịwo iwe gị dị ọkụ.+   Chineke nke nzọpụta anyị, biko, kpọghachite anyị, +Kwụsịkwa iwe ị na-eweso anyị.+   Ọ̀ bụ ruo mgbe ebighị ebi ka ị ga na-eweso anyị oké iwe?+Ị̀ ga na-eweso anyị iwe site n’ọgbọ ruo n’ọgbọ?+   Ọ̀ bụ na ị gaghị eme ka anyị dị ndụ ọzọ,+Ka ndị gị wee ṅụrịa ọṅụ n’ime gị?+   Jehova, biko, gosi anyị obiọma* gị,+Nyekwa anyị nzọpụta gị.+   M ga-anụ ihe ezi Chineke bụ́ Jehova ga-ekwu,+N’ihi na ọ ga-agwa ndị ya okwu udo,+ gwakwa ndị na-eguzosi ike n’ebe ọ nọ,Ma ka ha ghara ịlaghachi n’ịtụkwasị onwe ha obi.+   N’ezie, nzọpụta ya dị ndị na-atụ egwu ya nso,+Ka ebube ya wee dị n’ala anyị.+ 10  Ma obiọma na eziokwu ezutewo;+Ezi omume na udo esusuwo ọnụ.+ 11  Eziokwu ga-esi n’ala pulite,+Ezi omume ga-esikwa n’eluigwe ledata anya.+ 12  Jehova ga-enyekwa ihe dị mma,+Ala anyị ga-emepụta ihe nke ọma.+ 13  Ezi omume ga-eje ije n’ihu ya,+Ọ ga-awakwa ụzọ n’ebe Chineke zọrọ ụkwụ.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ, “ịhụnanya na-adịgide adịgide.”