Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet | BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Abụ Ọma 82:1-8

Abụ olu ụtọ Esaf. 82  Chineke guzo ná nzukọ+ nke Onye Dị Ike;+ Ọ na-ekpe ikpe n’etiti chi dị iche iche, na-asị:+   “Ruo ole mgbe ka unu ga na-ekpe ikpe na-ezighị ezi,+ Na-ele ndị ajọ omume anya n’ihu?+ Sila.   Bụrụnụ ndị ikpe nke onye ọ na-enweghị ka ọ hà ya na nwa na-enweghị nna.+ Kpeerenụ onye nọ n’ahụhụ na ogbenye ikpe ziri ezi.+   Meerenụ onye ọ na-enweghị ka ọ hà ya na ogbenye ụzọ mgbapụ;+ Napụtanụ ha n’aka ndị ajọ omume.”+   Ha amaghị, ha adịghịkwa aghọta;+ Ha na-ejegharị n’ọchịchịrị;+ A na-eme ka ntọala niile nke ụwa maa jijiji.+   “Mụ onwe m ekwuwo, sị, ‘Unu bụ chi,+ Unu niile bụ ụmụ nke Onye Kasị Elu.+   N’ezie, unu ga-anwụ dị nnọọ ka ndị mmadụ si anwụ;+ Unu ga-adakwa dị ka onye ọ bụla n’ime ndị isi si ada!’”+   Chineke, biko, bilie kpee ụwa ikpe;+ N’ihi na ọ bụ gị nwe mba niile.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji