Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet | BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Abụ Ọma 78:1-72

Maskil. Abụ ọma Esaf.+ 78  Ndị m, ṅaanụ ntị n’iwu m;+Tọọnụ ntị n’ala nụrụ okwu ọnụ m.+   M ga-emeghe ọnụ m tụọ ilu;+M ga-atụ ọtụtụ ilu a tụwara kemgbe oge dị anya gara aga,+   Bụ́ ndị anyị nụrụ, ndị anyị makwaara,+Ndị nna anyị hà kọọrọ anyị;+   Bụ́ ndị anyị na-adịghị ezoro ụmụ ha ezo,+Na-akọrọ ọbụna ọgbọ dị n’ihu ihe ndị a,+Bụ́ otuto Jehova na ike ya+Na ihe ndị dị ebube o mere.+   O wee debe ihe ncheta na Jekọb,+Meekwa ka e nwee iwu n’Izrel,+Bụ́ ihe o nyere nna nna anyị hà n’iwu,+Iji mee ka ụmụ ha mara ha;+   Ka ọgbọ nke na-abịa n’ihu, bụ́ ụmụ a ka ga-amụ, wee mara ha,+Ka ha wee bilie kọọrọ ha ụmụ ha,+   Ka ha wee nwee obi ike n’ebe Chineke nọ,+Gharakwa ichefu ihe Chineke mere,+ kama ka ha na-edebe ihe o nyere n’iwu.+   Ka ha wee ghara ịdị ka ndị nna nna ha,+Bụ́ ọgbọ dị isi ike, nke na-enupụkwa isi,+Ọgbọ nke na-edozighị obi ya,+Nke mmụọ ya na-atụkwasịghịkwa Chineke obi.+   N’agbanyeghị na ụmụ Ifrem bụ ndị na-agba ụta,+Ha gbara ọsọ n’ụbọchị agha.+ 10  Ha edebeghị ọgbụgba ndụ Chineke,+Ha jụkwara ije ije n’iwu ya.+ 11  Ha malitekwara ichefu ihe niile o mere+Nakwa ọrụ ya dị ebube ndị o mere ka ha hụ.+ 12  O mere ihe dị ịtụnanya n’ihu ndị nna nna ha+N’ala Ijipt,+ n’ala Zoan.+ 13  O kewara oké osimiri, ka o wee mee ka ha gafere,+O mekwara ka mmiri ya guzoro dị ka mmiri e gbochiri egbochi.+ 14  O wee jiri ígwé ojii na-edu ha n’ehihie,+Jirikwa ìhè ọkụ na-edu ha ogologo abalị dum.+ 15  O wee mee ka oké nkume gbawaa n’ala ịkpa,+Ka o wee mee ka ha ṅụjuo mmiri afọ dị ka à ga-asị na ha gara n’ogbu mmiri.+ 16  O wee mee ka mmiri si na nkume dị elu gbapụta,+Meekwa ka mmiri na-asọdata dị ka osimiri.+ 17  Ha wee na-emehie ya+Site n’inupụrụ Onye Kasị Elu isi n’ebe mmiri na-adịghị;+ 18  Ha wee nwaa Chineke ọnwụnwa n’ime obi ha+Site n’ikwu ka e nye mkpụrụ obi ha ihe ọ ga-eri.+ 19  Ha wee malite ikwu okwu megide Chineke.+Ha sịrị: “Chineke ò nwere ike inye anyị ihe oriri* n’ala ịkpa a?”+ 20  Lee! Ọ kụrụ ihe n’oké nkume+Ka mmiri wee gbapụta, ka mmiri na-asọ asọ wee nupụtakwa.+“Ò nwekwara ike inye ndị ya ihe oriri,+Ka ọ̀ pụrụ ime ka ha nweta ihe ha ga-eri?”+ 21  Ọ bụ ya mere Jehova ji wee oké iwe mgbe ọ nụrụ ya;+O mere ka ọkụ ree Jekọb,+O wee weso Izrel iwe dị ọkụ.+ 22  N’ihi na ha enweghị okwukwe n’ebe Chineke nọ,+Ha atụkwasịghịkwa obi ná nzọpụta si n’aka ya.+ 23  O wee nye ígwé ojii nke dị n’elu iwu,O meghekwara ọnụ ụzọ eluigwe.+ 24  O wee mee ka mana na-ezoro ha dị ka mmiri ka ha rie,+O nyekwara ha nri si n’eluigwe.+ 25  Ndị mmadụ riri nri nke ndị ka mmadụ ike;+O ziteere ha nri, ha wee rijuo afọ.+ 26  O mere ka ifufe nke si n’ebe ọwụwa anyanwụ malite ife n’eluigwe,+Jirikwa ike ya mee ka ifufe nke si n’ebe ndịda fee.+ 27  O wee mee ka ihe oriri zooro ha dị ka mmiri, o wee dị ka ájá dị n’ala,+Meekwa ka anụ ufe zooro ha dị ka mmiri, o wee dị ka ájá dị n’oké osimiri.+ 28  O wee mee ka ha na-ada n’etiti ebe ọ mara ụlọikwuu,+N’ebe niile n’ụlọikwuu ya.+ 29  Ha wee rie ihe rijuo afọ nke ọma,+O nyekwara ha ihe na-agụ ha.+ 30  Agụụ nke na-agụ ha ka nọ na-agụ ha,Mgbe ha ka kpụ nri ahụ n’ọnụ,+ 31  Mgbe ọnụma Chineke lara elu megide ha.+O wee malite igbu ndị ha gbasiri ike;+O mekwara ka ụmụ okorobịa Izrel daa. 32  N’agbanyeghị ihe a dum, ha nọ na-emehie,+Ha enweghịkwa okwukwe n’ọrụ niile dị ebube ọ rụrụ.+ 33  O wee mee ka ụbọchị ndụ ha gwụ dị ka à ga-asị na ọ bụ ume e kupụrụ ekupụ,+Meekwa ka afọ ndụ ha gwụ ná nsogbu. 34  Mgbe ọ bụla o gbuwere ha, ha na-achọ ya,+Ha na-alaghachi chọọ Chineke.+ 35  Ha wee malite icheta na Chineke bụ Oké Nkume ha,+Nakwa na Chineke bụ́ Onye Kasị Elu bụ Onye na-abọrọ ha ọbọ.+ 36  Ha wee nwaa iji ọnụ ha ghọgbuo ya;+Ha nwakwara iji ire ha ghaara ya ụgha.+ 37  Obi ha adịgideghịkwa n’ebe ọ nọ;+Ha ekwesịghịkwa ntụkwasị obi n’ọgbụgba ndụ ya.+ 38  Ma ọ na-eme ebere;+ ọ na-ekpuchi njehie ha,+ wee ghara ibibi ha.+O mekwara ka iwe ya dajụọ ọtụtụ ugboro,+Ọ dịghịkwa awụkwasị ha ọnụma ya dum. 39  Ọ nọgidere na-echeta na ha bụ anụ ahụ́,+Na mmụọ ha na-apụ apụ, ọ dịghịkwa alọghachite.+ 40  Lee ugboro ole ha nupụụrụ ya isi n’ala ịkpa,+Kpasuokwa ya iwe n’ọzara!+ 41  Ha nwara Chineke ọnwụnwa ugboro ugboro,+Ha mekwara ihe wutere Onye Nsọ Izrel.+ 42  Ha echetaghị aka ya,+Ha echetaghịkwa ụbọchị ọ gbapụtara ha n’aka onye mmegide,+ 43  Otú o si mee ihe ịrịba ama ya n’Ijipt,+Rụọkwa ọrụ ebube ya n’ala Zoan;+ 44  Na otú o si mee ka ọwa mmiri nke Naịl ghọọ ọbara,+Nke mere na ha enweghị ike ịṅụ mmiri iyi ha.+ 45  O wee zitere ha odudu, ka ọ na-ata ha;+Nakwa mbàrá, ka ọ laa ha n’iyi.+ 46  O wee mee ka ọchịcha malite ịta ihe ubi ha,Meekwa ka igurube taa ihe ha dọgburu onwe ha n’ọrụ nweta.+ 47  O wee jiri akụ́ mmiri ígwé gbuo osisi vaịn ha,+Jirikwa akụ́ mmiri ígwé gbuo osisi sịkamọ ha.+ 48  O wee mee ka akụ́ mmiri ígwé dagbuo anụ ndị na-eburu ha ibu,+Meekwa ka oké ahụ́ ọkụ gbuo anụ ụlọ ha. 49  O wee mee ka iwe ya nke dị ọkụ,+Oké iwe ya na amamikpe ya na ahụhụ, bịakwasị ha,+O zitekwaara ha ndị mmụọ ozi wetaara ha ọdachi.+ 50  O wee kwadebere iwe ya ụzọ.+O gbochighị mkpụrụ obi ha ịnwụ;O nyefekwara ndụ ha n’aka ọrịa na-efe efe.+ 51  N’ikpeazụ, o gburu ihe niile e bu ụzọ mụọ n’Ijipt,+Mmalite nke ike ịmụ ọmụmụ ha n’ụlọikwuu Ham.+ 52  E mesịa, o mere ka ndị ya pụọ dị nnọọ ka ìgwè atụrụ,+Wee duo ha n’ala ịkpa dị ka ìgwè ewu na atụrụ.+ 53  O wee na-edu ha n’enweghị ihe mere ha, egwu atụghịkwa ha;+Oké osimiri kpuchikwara ndị iro ha.+ 54  O wee kpọrute ha n’ókèala ya dị nsọ,+Bụ́ ógbè a nke bụ́ ugwu ugwu, bụ́ ebe aka nri ya nwetara.+ 55  O ji nwayọọ nwayọọ chụpụ mba dị iche iche n’ihi ha,+Jirikwa eriri e ji atụ̀ ihe kenye ha ihe nketa,+O wee mee ka ebo dị iche iche nke Izrel biri n’ụlọ nke ha.+ 56  Ha wee malite ịnwa Chineke bụ́ Onye Kasị Elu ọnwụnwa nakwa inupụrụ ya isi,+Ha edebeghịkwa ihe ncheta ya.+ 57  Dị ka ndị nna nna ha, ha nọ na-alaghachi azụ, na-aghọkwa aghụghọ;+Ha gbagọrọ agbagọ dị ka ụta a na-ekwesighị ike.+ 58  Ha wee jiri ebe ndị dị elu ha na-akpasu ya iwe,+Jirikwa ihe oyiyi ha a pịrị apị na-akpali ya ikwo ekworo.+ 59  Chineke nụrụ ya+ wee wee oké iwe,+O wee leghara Izrel anya kpamkpam.+ 60  N’ikpeazụ, ọ gbahapụrụ ụlọikwuu dị na Shaịlo,+Bụ́ ụlọikwuu o biri nke dị n’etiti ụmụ mmadụ.+ 61  O wee kwe ka a dọrọ ike ya n’agha,+Kwekwa ka onye mmegide weghara ịma mma ya.+ 62  O wee na-enyefe ndị ya n’aka mma agha,+O wesokwara ihe nketa ya oké iwe.+ 63  Ọkụ regburu ụmụ okorobịa ya,A jaghịkwa ụmụ agbọghọ ya mma.+ 64  E jikwa mma agha gbuo ndị nchụàjà ya,+Ndị inyom ha di ha nwụrụ ebeghịkwa ákwá.+ 65  Jehova wee teta dị ka à ga-asị na o si n’ụra,+Dị ka dike nke mmanya pụrụ n’anya.+ 66  O wee si n’azụ gbuo ndị na-emegide ya;+O mere ka ha nwee nkọcha ga-adịru mgbe a na-akaghị aka.+ 67  O wee jụ ụlọikwuu Josef;+Ọ họrọghịkwa ebo Ifrem.+ 68  Kama ọ họọrọ ebo Juda,+Bụ́ Ugwu Zayọn, nke ọ hụrụ n’anya.+ 69  O wee malite iwu ebe nsọ ya dị nnọọ ka ebe dị elu,+Dị ka ụwa nke ọ tọrọ ntọala ya ka ọ dịruo mgbe ebighị ebi.+ 70  O wee họrọ ohu ya bụ́ Devid,+O wee si n’ogige anụ ụlọ kpọrọ ya.+ 71  N’ebe ọ na-edugharị nne anụmanụ ndị na-enye ụmụ ara+Ka o si kpọrọ ya ka ọ bụrụ onye na-azụ Jekọb bụ́ ndị ya,+Na Izrel bụ́ ihe nketa ya, dị ka atụrụ.+ 72  O wee jiri ezi obi malite ịzụ ha dị ka atụrụ,+Jirikwa nkà ya na-edu ha.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Otú e si dee ya n’asụsụ Hibru bụ “ò nwere ike ido tebụl n’usoro n’ala ịkpa a?”