Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet | BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Abụ Ọma 74:1-23

Maskil. Abụ ọma Esaf.+ 74  Chineke, gịnị mere i ji jụ anyị ruo mgbe ebighị ebi?+ Gịnị mere i ji na-eweso ìgwè atụrụ gị nke nọ n’ebe ịta nri gị iwe dị ọkụ?+   Cheta nzukọ gị nke i nwetara n’oge dị anya gara aga,+Ebo ị gbapụtara ka ọ bụrụ ihe nketa gị,+Bụ́ Ugwu Zayọn a, bụ́ ebe i bi.+   Zọlie ije gaa n’ebe e bibiri mbibi ga-adịte aka.+Onye iro ebibiwo ihe niile dị n’ebe nsọ.+   Ndị na-ebuso gị iro ebigbọwo n’etiti ebe a na-ezute gị.+Ha egwunyewo ihe e ji mara ha ka ọ bụrụ ihe àmà.+   Onye nwere aha ọjọọ yiri mmadụ nke na-ebuli anyụike na-egbu osisi juru n’ọhịa.   Ha ji ọbụna obere anyụike na osisi nwere isi ígwè na-egbujasị ihe niile a tụrụ atụ́ ndị dị na ya.+   Ha atụbawo ebe nsọ gị n’ọkụ.+Ha emerụwo ụlọikwuu a kpọkwasịrị aha gị, merụọ ya ruo ala.+   Ha dum, ọbụna ụmụ ha, ekwuwo n’obi ha, sị:“A ga-agba ebe niile a na-ezute Chineke n’ala a ọkụ.”+   Anyị ahụghị ihe e ji mara anyị; e nwekwaghị onye amụma,+Ọ dịghị onye n’ime anyị nke maara mgbe ihe a ga-adịru. 10  Chineke, ruo ole mgbe ka onye mmegide ga na-akọcha gị?+Onye iro ọ̀ ga na-elelị aha gị ruo mgbe ebighị ebi?+ 11  Gịnị mere i ji sere aka gị, bụ́ aka nri gị,+N’obi gị, nke ga-eme ka anyị laa n’iyi? 12  Ma Chineke bụ Eze m malite n’ogologo oge gara aga,+Onye na-eme ka e nwee nzọpụta dị ukwuu n’ime ụwa.+ 13  Gị onwe gị ji ike gị kpasuo oké osimiri;+I tiwasịrị isi nnukwu anụ mmiri ndị nọ na mmiri.+ 14  Gị onwe gị gwerisịrị isi Levayatan.+I wee were ya nye ndị mmadụ, bụ́ ndị bi n’ógbè mmiri na-adịghị, ka ọ bụrụ ihe oriri ha.+ 15  Ọ bụ gị mere ka oké nkume gbawaa, mmiri na iyi na-asọ asọ wee na-asọpụta;+Gị onwe gị mere ka osimiri ndị na-asọ asọ mgbe niile taa.+ 16  Ọ bụ gị nwe ehihie; ọ bụkwa gị nwe abalị.+Gị onwe gị mere ihe na-enye ìhè, bụ́ anyanwụ.+ 17  Ọ bụ gị kpaara ụwa ókè ya niile;+Ọkọchị na udu mmiri—ọ bụ gị mere ha.+ 18  Cheta: Onye iro akọchawo gị, Jehova,+Ndị na-amaghị ihe elelịwokwa aha gị.+ 19  Ekwela ka anụ ọhịa napụ nduru gị mkpụrụ obi ya.+Echefula ndụ ndị gị nọ n’ahụhụ ruo mgbe ebighị ebi.+ 20  Lee anya n’ọgbụgba ndụ anyị na gị,+N’ihi na ebe ndị gbara ọchịchịrị n’ụwa ejupụtawo n’ebe obibi nke ime ihe ike.+ 21  Ekwela ka onye e gburu mmụọ ya buru ihere lọghachi.+Ka onye nọ n’ahụhụ na ogbenye too aha gị.+ 22  Chineke, biko, bilie kpeere onwe gị ikpe.+Cheta nkọcha onye nzuzu nọ na-akọcha gị ogologo ụbọchị dum.+ 23  Echefula ihe ndị iro gị na-ekwu.+Mkpọtụ nke ndị na-ebili imegide gị na-eme na-ala elu mgbe niile.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji