Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet | BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Abụ Ọma 73:1-28

Abụ olu ụtọ Esaf.+ 73  N’ezie, Chineke dị mma n’ebe Izrel nọ, n’ebe ndị obi ha dị ọcha nọ.+   Ma mụ onwe m, ọ fọrọ nke nta ka m zọhie ụkwụ,+Ọ fọrọ obere ka ụkwụ m gbụchapụ.+   N’ihi na amalitere m inwere ndị na-etu ọnụ anyaụfụ,+Mgbe m hụrụ udo ndị ajọ omume nwere.+   N’ihi na ha na-anwụ n’udo;+Ha nwekwara afọ ukwu.+   Ha anaghịdị enwe nsogbu mmadụ efu na-enwe,+Ha adịghịkwa enwe ihe otiti ndị ọzọ na-enwe.+   N’ihi ya, ha ejiriwo mpako mere ihe olu;+Ime ihe ike na-ekpuchikwa ha dị ka uwe.+   Anya ha zara aza n’ihi ibu ha buru;+Ha emewokwa ihe karịrị ihe ha chere n’obi ha.+   Ha na-akwa emo, na-ekwukwa banyere ihe ọjọọ;+Ha ji mpako na-ekwu okwu irigbu mmadụ.+   Ha emewo ka itu ọnụ ha ruo n’eluigwe,+Ha na-ejegharị n’ụwa, jiri ire ha na-ekwu ihe ọ bụla masịrị ha.+ 10  N’ihi ya, ọ na-akpọghachite ndị ya,A na-agbapụrụ ha mmiri dị ukwuu. 11  Ha asịwokwa: “Olee otú Chineke ga-esi mara?+Onye Kasị Elu ọ̀ ma ihe?”+ 12  Lee! Ndị a bụ ndị na-eme ihe ọjọọ, bụ́ ndị tụsaara ahụ́ ruo mgbe a na-akaghị aka.+Ha emewo ka akụ̀ ha dị ukwuu.+ 13  N’ezie, ọ bụ n’efu ka m meworo ka obi m dị ọcha,+Kwọọkwa aka m iji gosi na aka m dị ọcha.+ 14  A na-eti m ihe otiti ogologo ụbọchị dum,+A na-agbazikwa m kwa ụtụtụ.+ 15  A sị na m kwuru, sị: “M ga-akọ akụkọ yiri nke ahụ,”Lee! mgbe ahụ, ọ bụ aghụghọKa m ghọrọ ọgbọ na-abịa abịa, bụ́ ụmụ gị.+ 16  M wee na-atụgharị uche ka m wee mara nke a;+Ọ nọ na-enye m nsogbu, 17  Ruo mgbe m batara ná nnukwu ebe nsọ Chineke.+Anọ m na-achọ ịmata ihe ga-abụ ọdịnihu ha.+ 18  N’ezie, ọ bụ n’ala na-amị amị ka i mere ka ha nọrọ.+I mewo ka ha daa wee laa n’iyi.+ 19  Lee ka ha si ghọọ ihe ijuanya n’otu ntabi anya!+Lee ka ha si laa n’iyi, ka ha si tụọ ụjọ na mberede wee nwụọ! 20  Jehova, dị ka nrọ mmadụ chefuru mgbe o tetara n’ụra,+Otú ahụ ka ị ga-eleghara ọkwá ha anya mgbe i tetara.+ 21  N’ihi na obi adịghị m mma,+Akụrụ m gburu m oké mgbu,+ 22  Adịghị m eche echiche, amaghịkwa m ihe;+M yiri anụ ọhịa nkịtị n’anya gị.+ 23  Ma mụ na gị nọ mgbe niile;+I jidewo aka nri m.+ 24  Ị ga-eji ndụmọdụ gị na-edu m,+N’ikpeazụ, ị ga-edu m ka m nweta ihe ùgwù.+ 25  Ònye ka m nwere n’eluigwe?+Ọ dịghị ihe ọzọ na-enye m obi ụtọ n’ụwa ma e wezụga gị.+ 26  Anụ ahụ́ m na obi m adawo mbà.+Chineke bụụrụ obi m oké nkume, bụrụkwa òkè m ruo mgbe ebighị ebi.+ 27  N’ihi na, lee! ndị na-anọ gị n’ebe dị anya ga-ala n’iyi.+Ị ga-ebibi onye ọ bụla nke na-akwa iko site n’ịhapụ gị.+ 28  Ma mụ onwe m, ịbịaru Chineke nso dị m mma.+Ọ bụ Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova ka m ji mere ebe mgbaba,+Ka m wee kọsaa ọrụ ya niile.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji