Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet | BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Abụ Ọma 7:1-17

Abụ iru uju Devid, nke ọ bụkuru Jehova n’ihi ihe Kush onye ebo Benjamin kwuru. 7  Jehova Chineke m,+ n’ime gị ka m gbabaworo.+Zọpụta m n’aka ndị niile na-akpagbu m, napụtakwa m,+   Ka onye ọ bụla ghara ịdọri mkpụrụ obi m dị ka ọdụm si adọri anụ,+Wee dọkpụrụ m pụọ mgbe ọ na-adịghị onye ga-anapụta m.+   Jehova Chineke m, ọ bụrụ na ọ dị ihe m mere,+Ọ bụrụ na ọ dị ihe na-ezighị ezi m mere,+   Ọ bụrụ na mụ ejiriwo ihe ọjọọ kwụọ onye na-akwụ m ụgwọ ụgwọ,+Ma ọ bụ, ọ bụrụ na mụ ebukọrọwo ihe onye ọ bụla nke na-ebuso m iro, bụ́ onye na-adịghị emeta m ihe ọ bụla,+   Ka onye iro chụwa mkpụrụ obi m,+Ka ọ chụkwutekwa m ma zọda ndụ m n’alaWee mee ka otuto m biri n’ime ájá. Sila.   Jehova, biko, bilie n’iwe gị;+Bilie n’ihi oké iwe nke ndị na-ebuso m iro na-ewe,+Teta n’ihi m,+ ebe ọ bụ na i nyewo iwu ka e kpee ikpe.+   Ka mba dị iche iche zukọta gbaa gị gburugburu,Laghachi n’ebe dị elu ma megide ha.   Jehova ga-ekpe ndị dị iche iche ikpe.+Jehova, kpee m ikpe dị ka ezi omume m si dị+Nakwa dị ka iguzosi ike n’ezi ihe+ m si dị.   Biko, ka ihe ọjọọ nke ndị ajọ omume kwụsị,+Meekwa ka onye ezi omume guzosie ike;+Chineke bụ́ onye ezi omume+ na-enyocha obi+ na akụrụ.+ 10  Ọta m dị n’aka Chineke,+ bụ́ Onye na-azọpụta ndị obi ha ziri ezi.+ 11  Chineke bụ Onyeikpe nke na-ekpe ikpe ziri ezi,+Chineke na-ekwupụta amamikpe kwa ụbọchị. 12  Ọ bụrụ na mmadụ ajụ ịlaghachi azụ,+ Ọ ga-amụ mma agha ya,+Ọ ga-ekwe ụta ya, ọ ga-akwadebe ya ka ọ gbaa ya.+ 13  Ọ ga-akwadebere onwe ya ngwá ọgụ e ji egbu mmadụ;+Ọ ga-eme ka akụ́ ya bụrụ akụ́ na-ere ọkụ.+ 14  Lee! E nwere onye dị ime ihe ọjọọ,+Ọ tụrụwokwa nsogbu dị ka ime, ọ ghaghịkwa ịmụ okwu ụgha.+ 15  O gwuwo olulu, gwumie ya egwumi;+Ma ọ ga-adaba n’ime okokoro o gwuru.+ 16  Ọ ga-eji isi ya buru nsogbu ya,+Ọ ga-ejikwa opu isi ya buru ihe ike ọ na-eme.+ 17  M ga-eto Jehova dị ka ezi omume ya si dị,+M ga-abụkukwa aha+ Jehova bụ́ Onye Kasị Elu abụ olu ụtọ.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji