Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet | BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Abụ Ọma 64:1-10

Ntụziaka e nyere onye nduzi. Abụ olu ụtọ Devid. 64  Chineke, biko, nụrụ olu m n’ime nchegbu m.+ Chebe ndụ m ka m ghara ịtụ onye iro ụjọ.+   Zobe m ka okwu nzuzo nke ndị na-eme ihe ọjọọ ghara irute n’ebe m nọ,+ Tinyere oké aghara nke ndị na-eme ihe ọjọọ,+   Ndị mụworo ire ha amụ dị ka mma agha,+ Ndị tụdoworo mmadụ akụ́ ha, bụ́ okwu ọjọọ,+   Iji nọrọ n’ebe zoro ezo gbaa ya onye na-enweghị ihe a ga-eji taa ya ụta.+ Na mberede, ha na-agba ya ụta ahụ, ha adịghị atụ egwu.+   Ha na-ekwu okwu ọjọọ mgbe niile;+ Ha na-ekwu okwu isi ọnyà ma zoo ha.+ Ha asịwo: “Ònye ga-ahụ ha?”+   Ha na-echepụta ihe ọjọọ;+ Ha ezobewo atụmatụ aghụghọ ha ji akọ chepụta,+ Ihe dị n’ime onye nke ọ bụla, ya bụ, n’ime obi ya, dị omimi.+   Ma Chineke ga-agba ha akụ́ na mberede.+ O merụwo ha ahụ́,+   Ha na-emekwa ka mmadụ sụọ ngọngọ.+ Ma ire ha na-ekwu okwu megide ha.+ Ndị niile na-ele ha anya ga-efufe isi,+   Egwu ga-ejide mmadụ niile;+ Ha ga-akọ akụkọ ihe Chineke mere,+ Ha ga-aghọtakwa ọrụ ya.+ 10  Onye ezi omume ga-aṅụrị ọṅụ n’ime Jehova, gbabakwa n’ime ya;+ Ndị niile obi ha ziri ezi ga na-anyakwa isi.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji