Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet | BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Abụ Ọma 63:1-11

Abụ olu ụtọ Devid, mgbe ọ nọ n’ala ịkpa Juda.+ 63  Chineke, ị bụ Chineke m, m na-achọsi gị ike.+Agụụ gị na-agụ mkpụrụ obi m.+Agụụ gị emewo ka ike gwụ anụ ahụ́ mN’ala kpọrọ nkụ nke ihe na-adịghị, n’ebe mmiri na-adịghị.+   N’ihi ya, ahụwo m gị n’ebe nsọ,+Mgbe m hụrụ ike gị na ebube gị.+   N’ihi na obiọma gị dị mma karịa ndụ,+Egbugbere ọnụ m ga-aja gị mma.+   N’ihi ya, m ga-agọzi gị ụbọchị ndụ m niile;+M ga-agbasa ọbụ aka m n’aha gị.+   Afọ ejuwo mkpụrụ obi m dị ka à ga-asị na o riri ihe kasị mma, nke makwara abụba,+Ọnụ m ji egbugbere ọnụ nke na-eti mkpu ọṅụ na-eto gị.+   Mgbe m chetara gị n’elu ihe ndina m,+N’oge nche abalị, m na-atụgharị uche banyere gị.+   N’ihi na i nyeworo m aka,+Ọ bụkwa na ndò nku gị ka m na-eti mkpu ọṅụ.+   Mkpụrụ obi m na-esochi gị anya;+Aka nri gị jidesiri m ike.+   Ma ndị na-achọ mkpụrụ obi m ka ha bibie ya,+Ha ga-aba n’ime ala.+ 10  A ga-enyefe ha n’aka mma agha;+Ha ga-aghọ òkè e kenyere nkịta ọhịa.+ 11  Eze ga-aṅụrị ọṅụ n’ime Chineke.+Onye ọ bụla nke na-eji ya aṅụ iyi ga na-anya isi,+N’ihi na a ga-emechi ọnụ ndị na-ekwu okwu ụgha.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji