Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet | BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Abụ Ọma 55:1-23

Ntụziaka e nyere onye nduzi ụbọ akwara. Maskil. Abụ ọma Devid. 55  Chineke, biko, ṅaa ntị n’ekpere m;+ Ajụkwala ige ntị n’arịrịọ m na-arịọ ka i meere m amara.+   Biko, ṅaa m ntị ma za m.+ Nchegbu m emewo ka obi ghara izu m ike,+ Ọ dịghị ihe m pụrụ ime ma ọ bụghị inwe nchekasị,   N’ihi ihe onye iro na-ekwu, n’ihi nsogbu onye ajọ omume na-enye.+ N’ihi na ha na-eme ka ihe ọjọọ bịakwasị m,+ Ha jikwa iwe na-ebuso m iro.+   Obi m nọ n’oké ihe mgbu n’ime m,+ Ụjọ ọnwụ atụwala m.+   Egwu, ee, ụjọ ejidela m,+ Ana m ama jijiji.   Ana m asị: “A sị nnọọ na m nwere nku dị ka nduru!+ M ga-efepụ gaa biri n’ebe ọzọ.+   Lee! M ga-efega n’ebe dị anya;+ M ga-ebi n’ala ịkpa.+Sila   M ga-eme ngwa ngwa gbaba n’ebe m ga-anọ Zere ifufe na-efesi ike nakwa oké ifufe.”+   Jehova, biko, mee ka ha nwee mgbagwoju anya, kewaa ire ha,+ N’ihi na ahụwo m ime ihe ike na esemokwu n’obodo a.+ 10  Ha na-aga ije n’elu mgbidi ya, na-agba ya gburugburu ehihie na abalị;+ Ihe ọjọọ na nsogbu dịkwa n’ime ya.+ 11  Nsogbu jupụtara n’ime ya; Mmegbu na aghụghọ adịghịkwa apụ apụ n’ámá ya.+ 12  N’ihi na ọ bụghị onye iro kọchara m;+ A sị na ọ bụ ya, m gaara edi ya. Ọ bụghị onye kpọrọ m oké asị buliri onwe ya elu megide m;+ A sị na ọ bụ ya, m gaara ezo ka ọ ghara ịhụ m.+ 13  Kama ọ bụ gị, mmadụ efu nke mụ na ya hà,+ Onye m maara, bụ́ onye mụ na ya ma,+ 14  N’ihi na mụ na gị bụbu ezigbo enyi;+ Anyị na-esobu ìgwè mmadụ abanye n’ụlọ Chineke.+ 15  Ka mbibi bịakwasị ha!+ Ka ha gbadaa Shiol ná ndụ;+ N’ihi na ihe ọjọọ dị n’etiti ha n’oge ha bụ ndị mbịarambịa.+ 16  Ma, ọ bụ Chineke ka m ga-akpọku;+ Ọ bụkwa Jehova ga-azọpụta m.+ 17  N’anyasị, n’ụtụtụ nakwa n’ehihie, naanị ihe m na-eme bụ ichegbu onwe m na ibe ákwá,+ Ọ na-anụkwa olu m.+ 18  Ọ ga-anapụta mkpụrụ obi m n’ọgụ a na-alụso m, ọ ga-emekwa ka mkpụrụ obi m nọrọ n’udo,+ N’ihi na ha abịawo n’ìgwè imegide m.+ 19  Chineke ga-anụ olu m wee za ha,+ Ee, Onye ahụ nke nọ n’ocheeze kemgbe oge gara aga ga-anụ wee za ha+Sila Bụ́ ndị na-adịghị eme mgbanwe,+ Ndị na-adịghịkwa atụ egwu Chineke.+ 20  O setịwo aka ya megide ndị ya na ha dị ná mma;+ O mebiwo ọgbụgba ndụ ya.+ 21  Okwu ọnụ ya dị nro karịa mmiri ara ehi rahụrụ arahụ,+ Ma obi ya bụ ọgụ ọgụ.+ Okwu ya dị nro karịa mmanụ,+ Ma ha bụ mma agha a mịpụtara amịpụta.+ 22  Tụkwasị Jehova ibu arọ gị,+ Ya onwe ya ga-akwadokwa gị.+ Ọ dịghị mgbe ọ ga-ekwe ka onye ezi omume maa jijiji.+ 23  Ma gị onwe gị, Chineke, ga-eme ka ha gbadaa n’ala ala olulu.+ Ma ndị ikpe ọbara mara na ndị aghụghọ agaghị ebiru ọkara ndụ ha.+ Ma mụ onwe m ga-atụkwasị gị obi.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji