Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet | BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Abụ Ọma 54:1-7

Ntụziaka e nyere onye nduzi ụbọ akwara. Maskil. Abụ ọma Devid. Mgbe ndị Zif bịara gwa Sọl, sị: “Ị̀ makwa na Devid zoro n’etiti anyị?”+ 54  Chineke, biko, jiri aha gị zọpụta m,+ Jirikwa ike gị kpechite ọnụ m.+   Chineke, biko, nụrụ ekpere m;+ Ṅaa ntị n’ihe ọnụ m na-ekwu.+   N’ihi na e nwere ndị iro* bụ́ ndị biliworo imegide m, Na ndị aka ike bụ́ ndị na-achọ mkpụrụ obi m.+ Ha adịghị eme ka Chineke nọrọ n’ihu ha.+ Sila.   Lee! Chineke bụ onye na-enyere m aka;+ Jehova nọnyeere ndị na-akwado mkpụrụ obi m.   Ọ ga-akwụ ndị iro m ụgwọ ihe ọjọọ ha;+ Jiri eziokwu gị bibie ha.+   M ga-eji obi m dum chụọrọ gị àjà.+ Jehova, m ga-eto aha gị n’ihi na ọ dị mma.+   N’ihi na ọ napụtara m ná nsogbu niile,+ Ana m ele ndị iro m anya, na-achịkwa ha ọchị.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Otú e si dee ya n’asụsụ Hibru bụ “ndị ala ọzọ.”