Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet | BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Abụ Ọma 50:1-23

Abụ olu ụtọ Esaf.+ 50  Onye Dị Ike,+ Chineke, bụ́ Jehova,+ ekwuwo okwu,+O wee kpọọ ụwa òkù,+Malite n’ọwụwa anyanwụ ruo n’ọdịda ya.+   Chineke si na Zayọn, bụ́ ebe mma ruru gwụ,+ nwuo dị ka ìhè.+   Chineke anyị ga-abịa, ọ pụghịkwa ịgbachi nkịtị.+Ọkụ na-eripịa ihe n’ihu ya,+Oké ifufe na-efesikwa ike gburugburu ya.+   Ọ na-akpọ eluigwe na ụwa òkù+Ka o wee mee ihe o kpere n’ikpe n’ahụ́ ndị ya:+   “Kpọkọtara m ndị na-eguzosi ike n’ebe m nọ,+Ndị mụ na ha ji àjà gbaa ndụ.”+   Eluigwe na-akọ ezi omume ya,+N’ihi na Chineke bụ Onyeikpe.+ Sila.   “Ndị m, geenụ ntị, m ga-ekwu okwu,+Izrel, gee ntị, m ga-agba akaebe megide gị.+Abụ m Chineke, bụ́ Chineke gị.+   Ọ bụghị n’ihi àjà ndị ị na-achụ ka m ji na-abara gị mba,+Ọ bụghịkwa n’ihi àjà ị na-esurecha n’ọkụ, bụ́ ndị dị n’ihu m mgbe niile.+   Agaghị m akpụrụ oké ehi n’ụlọ gị,+Agaghịkwa m akpụrụ mkpi n’ogige anụ ụlọ gị. 10  N’ihi na ọ bụ m nwe anụ ọhịa niile dị n’oké ọhịa,+Bụ́ anụmanụ ndị nọ n’elu otu puku ugwu.+ 11  Amaara m anụ ufe niile nke ugwu,+Ìgwè anụmanụ ndị bi n’ọhịa dịkwa n’aka m.+ 12  Ọ bụrụ na agụụ agụwa m, agaghị m agwa gị;N’ihi na ọ bụ m nwe elu ala+ na ihe niile dị na ya.+ 13  M̀ ga-eri anụ oké ehi ndị dị ike,+M̀ ga-aṅụ ọbara mkpi?+ 14  Chụọrọ Chineke ekele dị ka àjà gị,+Nyekwa Onye Kasị Elu ihe ndị i kwere ya ná nkwa;+ 15  Kpọkuokwa m n’ụbọchị nsogbu.+M ga-anapụta gị, gị onwe gị ga-enyekwa m otuto.”+ 16  Ma Chineke ga-asị onye ajọ omume:+“Ònye nyere gị ikike ịgụpụta ụkpụrụ m,+Na iji ọnụ gị na-ekwu banyere ọgbụgba ndụ m?+ 17  Lee, gị onwe gị kpọrọ ịdọ aka ná ntị asị,+Ị na-elegharakwa okwu m anya.+ 18  Mgbe ọ bụla ị hụrụ onye ohi, ihe ya na-amasị gị;+Ọ bụkwa ndị na-akwa iko ka gị na ha na-emekọ ihe.+ 19  I meghewo ọnụ na-ekwu ihe ọjọọ,+Ire gị anaghị ahapụ aghụghọ.+ 20  Ị na-anọdụ ala na-ekwu okwu ọjọọ banyere nwanne gị,+Ị na-ekwutọkwa nwa nne gị mụrụ.+ 21  I mere ihe ndị a, ma m gbachiri nkịtị.+I chere na m ga-adị ka gị.+M ga-abara gị mba,+ m ga-emekwa ka ihe i mere doo gị anya.+ 22  Biko, ghọtanụ ihe a, unu ndị na-echefu Chineke,+Ka m wee ghara ịdọri unu n’enweghị onye ga-anapụta unu.+ 23  Ọ bụ onye na-achụ ekele dị ka àjà bụ onye na-enye m otuto;+Ma onye na-agbaso ụzọ kwụ ọtọ,M ga-eme ka ọ hụ nzọpụta nke si n’aka Chineke.”+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji