Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet | BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Abụ Ọma 5:1-12

Ntụziaka e nyere onye na-eduzi Nihilọt. Abụ olu ụtọ Devid. 5  Jehova, biko, nụrụ ihe m na-ekwu;+Ghọta ịsụ ude m.   Eze m+ na Chineke m, biko, ṅaa ntị ná mkpu enyemaka m na-eti,+n’ihi na ọ bụ gị ka m na-ekpeku ekpere.+   Jehova, biko, nụrụ olu m n’ụtụtụ;+M ga-agwa gị okwu n’ụtụtụ ma chere.+   N’ihi na ị bụghị Chineke nke ajọ omume na-atọ ụtọ;+Onye ọjọọ agaghị ebinyere gị ma ọlị.+   Ndị na-etu ọnụ agaghị eguzo n’ihu gị.+Ị kpọrọ ndị niile na-eme ihe ọjọọ asị;+   Ị ga-ebibi ndị na-ekwu okwu ụgha.+Jehova kpọrọ onye na-awụfu ọbara+ na onye na-aghọ aghụghọ+ asị.   Ma mụ onwe m, n’ihi obiọma* gị dị ukwuu,+M ga-abata n’ụlọ gị,+M ga-eche ihu n’ụlọ nsọ gị kpọọ isiala n’ihi egwu m na-atụ gị.+   Jehova, biko, duo m n’ezi omume+ gị n’ihi na ndị iro gbara m gburugburu;+Mee ka ụzọ gị dị larịị n’ihu m.+   N’ihi na ọ dịghị ihe si ha n’ọnụ a pụrụ ịtụkwasị obi;+Ime afọ ha bụ nnọọ ahụhụ.+Akpịrị ha bụ ili ghere oghe;+Ire ụtọ ka ha ji ekwu okwu.+ 10  Chineke ga-ama ha ikpe;+Atụmatụ ha ga-eme ka ha daa.+Ka a chụsaa ha n’ihi na mmebi iwu ha dị ukwuu,+N’ihi na ha nupụụrụ gị isi.+ 11  Ma ndị niile na-agbaba n’ime gị ga-aṅụrị ọṅụ;+Ha ga na-eti mkpu ọṅụ ruo mgbe ebighị ebi.+Ị ga-echebe ha,Ndị hụrụ aha gị n’anya ga-enwekwa aṅụrị n’ime gị.+ 12  N’ihi na gị onwe gị, Jehova, ga-agọzi onye ọ bụla bụ́ onye ezi omume;+Ị ga-eji ihu ọma gbaa ya gburugburu+ dị ka à ga-asị na ọ bụ ọta ukwu.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ, “ịhụnanya na-adịgide adịgide.”