Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Họrọ asụsụ Igbo

Abụ Ọma 44:1-26

Ntụziaka e nyere onye nduzi. Abụ ọma nke ụmụ Kora.+ Maskil. 44  Chineke, anyị ejiriwo ntị anyị nụ,Nna nna anyị hà akọworo anyị+Ihe i mere n’oge ha,+N’oge dị anya gara aga.+   Gị onwe gị ji aka gị chụpụ ọbụna mba dị iche iche,+I wee kụọ ha dị ka mkpụrụ ka ha nọchie ha.+I wee merie mba dị iche iche, chụpụkwa ha.+   N’ihi na ọ bụghị mma agha ha ka ha ji nweta ala ahụ,+Ọ bụghịkwa ogwe aka ha wetaara ha nzọpụta.+N’ihi na ọ bụ aka nri gị na ogwe aka gị+ nakwa ìhè nke ihu gị,N’ihi na ihe ha masịrị gị.+   Chineke, gị onwe gị bụ Eze m.+Nye iwu ka Jekọb nweta nzọpụta dị ukwuu.+   Anyị ga-enupụ ndị na-emegide anyị site n’enyemaka gị;+Anyị ga-eji aha gị zọda ndị na-ebili imegide anyị.+   N’ihi na ọ bụghị n’ụta m ka m tụkwasịrị obi,+Ọ bụghịkwa mma agha m nọ na-azọpụta m.+   N’ihi na ị zọpụtara anyị n’aka ndị na-emegide anyị,+Ọ bụkwa ndị kpọrọ anyị oké asị ka i menyere ihere.+   Ọ bụ Chineke ka anyị ga-enye otuto ogologo ụbọchị dum,+Anyị ga-etokwa aha gị ruo mgbe ebighị ebi.+ Sila.   Ma ugbu a, ị jụwo anyị ma na-eweda anyị ala,+Ị dịghịkwa eso ndị agha anyị eje agha.+ 10  I mere ka anyị na-agba ọsọ n’ihu ndị na-emegide anyị,+Ndị kpọrọ anyị oké asị akwakọrọla ihe anyị.+ 11  Ị na-agbahapụ anyị dị ka atụrụ, dị ka anụ oriri,+Ị chụsawokwa anyị n’etiti mba niile.+ 12  Ị na-ere ndị gị n’ọnụ ahịa na-enweghị ihe o ruru,+Ọ dịghịkwa uru i ritere n’ihe i retara ha. 13  I mewo ka anyị bụrụ ndị ndị agbata obi anyị na-akọcha,+Bụrụkwa ndị ndị niile nọ anyị gburugburu na-akwa emo, na-akparịkwa.+ 14  I mewo ka anyị bụrụ ihe e ji atụ ilu n’etiti mba niile,+Ihe a na-efufere isi n’etiti mba dị iche iche.+ 15  Mweda n’ala m dị n’ihu m ogologo ụbọchị dum,Ihere ejuwo m ihu,+ 16  N’ihi olu nke onye na-akọcha m ma na-ekwujọ m,N’ihi onye iro na onye na-abọrọ onwe ya ọbọ.+ 17  Ihe a dum bụ ihe bịakwasịrị anyị, ma anyị echefughị gị,+Anyị emebighịkwa ọgbụgba ndụ gị.+ 18  Obi anyị esighị n’ebe ị nọ pụọ,+Ụkwụ anyị esighịkwa n’ụzọ gị pụọ.+ 19  N’ihi na i gwepịawo anyị n’ebe nkịta ọhịa na-ezukọta,+I jiriwokwa oké ọchịchịrị kpuchie anyị.+ 20  A sị na anyị echefuwo aha Chineke anyị,Ma ọ bụ gbasapụrụ chi ọzọ ọbụ aka anyị,+ 21  Chineke ọ́ gaghị achọpụta?+N’ihi na ọ maara ihe nzuzo niile nke obi.+ 22  Ma, ọ bụ n’ihi gị ka e ji na-egbu anyị ogologo ụbọchị dum;E werewo anyị dị ka atụrụ a ga-egbu egbu.+ 23  Jehova, biko, bilie. Gịnị mere i ji na-ehi ụra?+Teta. Ajụla anyị ruo mgbe ebighị ebi.+ 24  Gịnị mere i ji wepụ ihu gị?Gịnị mere i ji chefuo ahụ́ a na-emekpa anyị na mmegbu a na-emegbu anyị?+ 25  N’ihi na mkpụrụ obi anyị ehulatawo ala ruo n’ájá;+Afọ anyị araparawo n’ala. 26  Bilie nyere anyị aka,+Napụtakwa anyị n’ihi obiọma* gị.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ, “ịhụnanya na-adịgide adịgide.”