Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet | BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Abụ Ọma 43:1-5

43  Chineke, biko, kpee m ikpe,+Kpechite ọnụ m+ n’ikpe mụ na mba nke na-adịghị eguzosi ike n’ihe nwere.Meere m ụzọ m ga-esi gbapụ n’aka onye aghụghọ nke bụkwa onye ajọ omume.+   N’ihi na ị bụ Chineke m, nke bụ́ ebe m e wusiri ike.+Gịnị mere i ji jụ m?Gịnị mere m ji na-ejegharị ná mwute n’ihi mmegbu si n’aka onye iro?+   Zipụ ìhè gị nakwa eziokwu gị.+Ka ha na-edu m.+Ka ha duru m rute n’ugwu nsọ gị nakwa n’ụlọikwuu gị dị ebube.+   M ga-abịakwa n’ebe ịchụàjà nke Chineke,+Bịakwute Chineke, bụ́ oké ọṅụ m.+M ga-ejikwa ụbọ akwara too gị, Chineke, bụ́ Chineke m.+   Mkpụrụ obi m, gịnị mere i ji daa mbà,+Gịnịkwa mere i ji na-agba ghara ghara n’ime m?Chere Chineke,+N’ihi na m ka ga-enye ya otuto dị ka onye na-enye m nzọpụta dị ukwuu nakwa dị ka Chineke m.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji