Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet | BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Abụ Ọma 42:1-11

Ntụziaka e nyere onye nduzi. Maskil maka ụmụ Kora.+ 42  Dị ka mmiri si agụsi nne ele ike,Otú ahụ ka ị na-agụsi mkpụrụ obi m ike, Chineke.+   Agụụ Chineke,+ bụ́ Chineke dị ndụ,+ na-agụ mkpụrụ obi m.Olee mgbe m ga-abịa n’ihu Chineke?+   Anya mmiri m aghọworo m ihe oriri ma n’ehihie ma n’abalị,+Ka ha nọ na-asị m ogologo ụbọchị dum: “Olee ebe Chineke gị nọ?”+   M ga-echeta ihe ndị a, m ga-awụpụkwa mkpụrụ obi m n’ime m dị ka mmiri.+N’ihi na m na-esobu ìgwè mmadụ na-aga,M na-ebutere ha ụzọ jiri nwayọọ nwayọọ na-aga n’ụlọ Chineke,+Anyị na-etiri mkpu ọṅụ na mkpu ekele na-aga,+Dị ka ìgwè ndị na-eme ememme.+   Mkpụrụ obi m, gịnị mere i ji daa mbà,+Gịnịkwa mere i ji agba ghara ghara n’ime m?+Chere Chineke,+N’ihi na m ka ga-enye ya otuto dị ka onye na-enye m nzọpụta dị ukwuu.+   Chineke m, mkpụrụ obi m adawo mbà n’ime m.+Ọ bụ ya mere m ji na-echeta gị,+Malite n’ala Jọdan nakwa n’elu elu ugwu Hemọn,+Malite n’ugwu nta.+   Ogbu mmiri na-akpọ ogbu mmiri òkùMgbe ọ nụrụ ụda mmiri gị nke na-asọda asọda.Oké ebili mmiri gị niile+N’elu m ka ha gafeworo.+   Jehova ga-enye obiọma* ya iwu n’ehihie ka ọ bịakwute m,+Abụ ya ga-adịkwa n’ọnụ m n’abalị;+M ga-ekpeku Chineke mere ka m dị ndụ ekpere.+   M ga-agwa Chineke bụ́ nkume m dị elu, sị:+“Gịnị mere i ji chefuo m?+Gịnị mere m ji na-ejegharị ná mwute n’ihi mmegbu si n’aka onye iro?”+ 10  Ndị na-ebuso m iro akọchawo m nke ukwuu nke na ọ dị ka à ga-asị na e gwepịara ọkpụkpụ m,+Ka ha nọ na-asị m ogologo ụbọchị dum: “Olee ebe Chineke gị nọ?”+ 11  Mkpụrụ obi m, gịnị mere i ji daa mbà,+Gịnịkwa mere i ji na-agba ghara ghara n’ime m?+Chere Chineke,+N’ihi na m ka ga-enye ya otuto dị ka onye na-enye m nzọpụta dị ukwuu nakwa dị ka Chineke m.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ, “ịhụnanya na-adịgide adịgide.”