Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet | BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Abụ Ọma 38:1-22

Abụ olu ụtọ Devid, nke e ji echeta ihe. 38  Jehova, biko, abarala m mba n’iwe gị,+ Ejikwala iwe gbazie m.+   N’ihi na akụ́ gị abamiwo abami n’ahụ́ m,+ Aka gị abịakwasịwo m.+   Ahụ́ niile na-egbu m mgbu n’ihi amamikpe gị.+ Ọkpụkpụ m ezughịkwa ike n’ihi mmehie m.+   N’ihi na njehie m erikpuwo isi m;+ Dị ka ibu dị arọ, ọ dị arọ nke na agaghị m ebuli ya.+   Ọnyá m esiwela ísì, ọ basawo, N’ihi nzuzu m.+   Obi erukwaghị m ala, adawo m mbà nke ukwuu;+ Ejegharịwo m ná mwute ogologo ụbọchị dum.+   N’ihi na úkwù m niile na-ere m ọkụ, Ahụ́ niile na-egbu m mgbu.+   Ahụ́ akụnwụwo m, e gbuwokwa mmụọ m nke ukwuu; Ebigbọwo m n’ihi ịsụ ude nke obi m.+   Jehova, ọ bụ n’ihu gị ka ọchịchọ m dum dị, Ịsụ ude m abụghịkwa ihe zoro ezo n’ebe ị nọ.+ 10  Obi m na-akụsi ike, ike agwụwokwa m, Anya m adịkwaghị ahụ ụzọ.+ 11  Ma ndị m hụrụ n’anya na ndị enyi m na-agbara m ọsọ n’ihi ọrịa m,+ Ndị mụ na ha na-akpachi anya eguzopụwokwa iche n’ebe dị anya.+ 12  Ma ndị na-achọ mkpụrụ obi m na-esi ọnyà,+ Ndị na-akpa nkata ka ọdachi dakwasị m ekwuwokwa okwu banyere ahụhụ,+ Ha na-atamukwa okwu aghụghọ ogologo ụbọchị dum.+ 13  Ma mụ onwe m, dị ka onye ntị chiri, anụghị m ihe ha na-ekwu;+ Dị ka onye ogbi, emegheghị m ọnụ.+ 14  M wee dị ka onye na-adịghị anụ ihe, Enweghị m ihe m ga-aza ha. 15  N’ihi na ọ bụ gị, Jehova, ka m cheere;+ Gị onwe gị, Jehova Chineke m, wee za.+ 16  N’ihi na m sịrị: “Ma ọ́ bụghị ya, ha ga-aṅụrị ọṅụ n’ihi ihe mere m;+ Mgbe ụkwụ na-esighị m ike n’ala,+ ha ga-ebuli onwe ha elu megide m.”+ 17  N’ihi na ọ fọrọ nke nta ka m tee ụkwụ,+ Ihe mgbu m dịkwa n’ihu m mgbe niile.+ 18  N’ihi na m kọrọ njehie m;+ M wee malite ichegbu onwe m n’ihi mmehie m.+ 19  Ndị iro m bụ́ ndị dị ndụ ewee dị ike,+ Ndị kpọrọ m asị na nkịtị ewee dị ọtụtụ.+ 20  Ha ji ihe ọjọọ na-akwụ m ụgwọ ihe ọma;+ Ha nọ na-eguzogide m n’ihi na m na-achụso ihe ọma.+ 21  Jehova, biko, ahapụla m. Chineke m, biko, anọla m n’ebe dị anya.+ 22  Bịa ngwa ngwa nyere m aka,+ Jehova bụ́ nzọpụta m.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji