Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet | BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Abụ Ọma 31:1-24

Ntụziaka e nyere onye nduzi. Abụ olu ụtọ Devid. 31  Jehova, agbabawo m n’ime gị.+Biko, ekwela ka ihere mee m ma ọlị.+Meere m ụzọ mgbapụ n’ihi ezi omume gị.+   Tọọrọ m ntị n’ala.+Napụta m ọsọ ọsọ.+Ghọọrọ m ebe e ji oké nkume wusie ike,+Bụ́ ụlọ e wusiri ike iji zọpụta m.+   N’ihi na ị bụ nkume m dị elu na ebe m e wusiri ike;+Butere m ụzọ ma na-edu m+ n’ihi aha gị.+   Mee ka m si n’ụgbụ ha ji siere m ọnyà pụta,+N’ihi na ị bụ ebe m e wusiri ike.+   N’aka gị ka m na-enyefe mmụọ m.+Ị napụtawo m,+ Jehova Chineke nke eziokwu.+   M kpọrọ ndị ji arụsị efu na-abaghị uru kpọrọ ihe asị;+Ma mụ onwe m, ọ bụ Jehova ka m tụkwasịrị obi.+   M ga-aṅụrị ọṅụ, nweekwa obi ụtọ n’obiọma* gị,+N’ihi na ị hụwo mmekpa ahụ́ m;+Ị marawo ahụhụ mkpụrụ obi m na-ata,+   I nyefeghị m n’aka onye iro.+I mewo ka ụkwụ m guzoro n’ebe sara mbara.+   Meere m amara, Jehova, n’ihi na anọ m n’oké ihe isi ike.+Anya m adịkwaghị ahụcha ụzọ n’ihi iru uju,+ ike agwụla mkpụrụ obi m, gwụkwa afọ m.+ 10  N’ihi na iru uju egbuwo m,+Afọ ndụ m agwụla n’ịsụ ude.+Ike agwụla m n’ihi njehie m,+Ọkpụkpụ m esikwaghị ike.+ 11  Aghọwo m onye a na-akọcha+ n’anya ndị niile na-ebuso m iro,+Otú ahụkwa ka m dị n’anya ndị agbata obi m,+Abụkwa m onye ndị mụ na ha ma na-atụ ụjọ.+Mgbe ha hụrụ m n’èzí, ha na-agbara m ọsọ.+ 12  E chezọwo m dị ka onye nwụrụ anwụ nke a na-adịghị echetakwa;+Adịzi m ka arịa kụwara akụwa;+ 13  N’ihi na anụwo m akụkọ ọjọọ nke ọtụtụ ndị na-akọ,+Ụjọ dịkwa n’ebe niile.+Mgbe ha gbakọtara dị ka otu onye imegide m,+Ọ bụ iwepụ mkpụrụ obi m ka ha na-eme atụmatụ ya.+ 14  Ma mụ onwe m—ọ bụ gị, Jehova, ka m tụkwasịrị obi.+Asịwo m: “Ị bụ Chineke m.”+ 15  Ụbọchị m niile dị n’aka gị.+Napụta m n’aka ndị iro m nakwa n’aka ndị na-achụ m.+ 16  Mee ka ohu gị nweta ihu ọma gị.+Jiri obiọma gị zọpụta m.+ 17  Jehova, biko, ekwela ka ihere mee m, n’ihi na ọ bụ gị ka m na-akpọku.+Ka ihere mee ndị ajọ omume;+Ka ha mechie ọnụ n’ime Shiol.+ 18  Ka egbugbere ọnụ nke na-ekwu okwu ụgha daa ogbi,+Bụ́ egbugbere ọnụ nke na-emepe ọnụ jiri mpako na nlelị+ na-ekwu okwu megide onye ezi omume.+ 19  Lee ka ịdị mma gị si dị ukwuu,+ nke i debeere ndị na-atụ egwu gị!+Nke i gosiri ndị na-agbaba n’ime gị,N’ihu ụmụ mmadụ.+ 20  Zobe ha n’ebe nzuzo gị,+Ka ha ghara ịdaba n’aka ndị mmadụ jikọrọ aka.+Zobe ha n’ụlọ ndò gị ka ha zere ire na-ese okwu.+ 21  Ka Jehova bụrụ onye a gọziri agọzi,+N’ihi na o gosiwo m obiọma na-enweghị atụ+ n’ime obodo nke nọ n’ihe isi ike.+ 22  Ma mụ onwe m, mgbe ụjọ tụwara m,+ asịrị m:“A ga-ekpochapụ m n’ihu gị.”+Ị nụwo olu arịrịọ m mgbe m tikuru gị maka enyemaka.+ 23  Hụnụ Jehova n’anya, unu niile ndị na-eguzosi ike n’ebe ọ nọ.+Jehova na-echebe ndị kwesịrị ntụkwasị obi,+Ma ọ na-akwụ onye ọ bụla nke dị mpako ụgwọ dị ukwuu.+ 24  Nweenụ obi ike, ka obi siekwa unu ike,+Unu niile ndị na-echere Jehova.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ, “ịhụnanya na-adịgide adịgide.”