Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet | BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Abụ Ọma 29:1-11

Abụ olu ụtọ Devid. 29  Nyenụ Jehova otuto, unu ụmụ nke ndị dị ike, Nyenụ Jehova otuto, kwuonụ na ọ dị ike.+   Nyenụ Jehova otuto kwesịrị aha ya.+ Yirinụ uwe mara mma nke dị nsọ kpọọrọ Jehova isiala.+   Olu Jehova na-ada n’elu mmiri;+ Chineke nke dị ebube+ ebigbọwo.+ Jehova nọ n’elu ọtụtụ mmiri.+   Olu Jehova dị ike;+ Olu Jehova dị ebube.+   Olu Jehova na-agbaji osisi sida; Ee, Jehova na-agbaji osisi sida ndị dị na Lebanọn irighiri irighiri,+   Ọ na-eme ka ha na-awụgharị dị ka nwa ehi,+ Ọ na-emekwa ka Lebanọn na Siriọn+ na-awụgharị dị ka ụmụ atụ́.   Olu Jehova ji ire ọkụ na-adapụta;+   Olu Jehova na-eme ka ala ịkpa maa jijiji,+ Jehova na-eme ka ala ịkpa Kedesh+ maa jijiji.   Olu Jehova na-eme ka ime malite ime nne ele,+ Na-emekwa ka oké ọhịa tọgbọrọ n’efu.+ N’ụlọ nsọ ya kwa, onye ọ bụla na-asị: “Ebube!”+ 10  Jehova anọdụwo n’elu iju mmiri;+ Jehova nọkwa ọdụ dị ka eze ruo mgbe ebighị ebi.+ 11  Jehova ga-enye ndị ya ume.+ Jehova ga-eji udo gọzie ndị ya.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji