Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet | BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Abụ Ọma 27:1-14

Abụ ọma Devid. 27  Jehova bụ ìhè m+ na nzọpụta m.+Ònye ka m ga-atụ egwu?+Jehova bụ idé ji ndụ m.+Ònye ka m ga-atụ ụjọ?+   Mgbe ndị na-eme ihe ọjọọ na-achụ m ka ha rie anụ ahụ́ m,+Ebe ha bụ ndị na-emegide m na ndị iro m,+Ha onwe ha sụrụ ngọngọ wee daa.+   Ọ bụrụgodị na ndị agha amaa ụlọikwuu ibuso m agha,+Obi m agaghị atụ egwu.+Ọ bụrụgodị na e buso m agha,+M ka ga na-atụkwasị ya obi.+   Otu ihe ka m rịọrọ Jehova+Ọ bụ ihe m ga-achọ,+Ka m biri n’ụlọ Jehova ụbọchị niile nke ndụ m,+Ka m wee na-ahụ ịdị mma Jehova,+Ka m wee jirikwa obi ekele na-ele ụlọ nsọ ya anya.+   N’ihi na ọ ga-ezobe m n’ụlọ ya n’ụbọchị ọdachi;+Ọ ga-ezobe m n’ebe zoro ezo n’ụlọikwuu ya;+Ọ ga-ekugo m n’elu oké nkume.+   A ga-ebuli isi m elu karịa ndị iro m gbara m gburugburu;+M ga-achụkwa àjà mkpu ọṅụ n’ụlọikwuu ya;+M ga-abụ abụ ma bụkuo Jehova abụ olu ụtọ.+   Jehova, biko, nụrụ mgbe m ji olu m kpọkuo gị,+Meere m amara za m.+   Obi m ekwuwo banyere ihe i nyere anyị n’iwu, sị: “Chọọnụ ihu ọma m.”+Jehova, ọ bụ ihu ọma gị ka m ga-achọ.+   Ewepụla ihu gị n’ebe m nọ.+Ejila iwe chụpụ ohu gị.+Bụrụ onye na-enyere m aka.+Agbahapụla m, ahapụkwala m, Chineke nke nzọpụta m.+ 10  Ọ bụrụ na nna m na nne m ahapụ m,+Jehova ga-akpọrọ m.+ 11  Jehova, biko, zi m ụzọ gị,+Duokwa m n’ụzọ ezi omume n’ihi ndị iro m. 12  Enyefela m n’aka mkpụrụ obi nke ndị na-emegide m;+N’ihi na ndị akaebe ụgha ebiliwo imegide m,+Onye na-ekupụ ime ihe ike dị ka ume ebiliwokwa imegide m.+ 13  Gịnị ka m gaara eme ma a sị nnọọ na enweghị m okwukwe n’ịhụ ịdị mma Jehova n’ala ndị dị ndụ?+ 14  Nwee olileanya n’ebe Jehova nọ;+ nwee obi ike, ka obi siekwa gị ike.+Ee, nwee olileanya n’ebe Jehova nọ.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji