Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet | BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Abụ Ọma 26:1-12

Abụ ọma Devid. 26  Kpee m ikpe,+ Jehova, n’ihi na mụ onwe m ejewo ije n’iguzosi ike n’ezi ihe nke m,+ Ọ bụkwa Jehova ka m tụkwasịrị obi, ka m wee ghara ịma jijiji.+   Jehova, nyochaa m, leekwa m ule;+ Nụchaa akụrụ m na obi m.+   N’ihi na obiọma* gị dị n’ihu m, Ejewokwa m ije n’eziokwu gị.+   Mụ na ndị ụgha adịghị anọkọ;+ Mụ na ndị na-ezochi ihe ha bụ adịghị akpakọrịta.+   M kpọrọ ọgbakọ nke ndị na-eme ihe ọjọọ asị,+ Mụ na ndị ajọ omume adịghịkwa anọkọ.+   M ga-akwọ aka m iji gosi na aka m dị ọcha,+ Jehova, m ga-agakwa ebe ịchụàjà gị gburugburu,+   Iji mee ka a nụ ekele m na-enye n’olu dara ụda,+ Nakwa iji kọsaa ọrụ gị niile dị ebube.+   Jehova, ahụrụ m ụlọ gị nke bụ́ ebe obibi gị n’anya+ Nakwa ebe ebube gị bi.+   Ewepụkọtala mkpụrụ obi m na ndị mmehie,+ Ewepụkọtakwala ndụ m na ndị ikpe ọbara mara,+ 10  Bụ́ ndị na-eme omume rụrụ arụ,+ Ndị aka nri ha jupụtakwara n’iri ngarị.+ 11  Ma mụ onwe m ga-eje ije n’iguzosi ike n’ezi ihe nke m.+ Napụta m+ ma meere m amara.+ 12  Ụkwụ m ga-eguzo n’ebe dị larịị;+ M ga-agọzi Jehova n’etiti ìgwè ndị zukọrọ ọnụ.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ, “ịhụnanya na-adịgide adịgide.”