Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet | BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Abụ Ọma 21:1-13

Ntụziaka e nyere onye nduzi. Abụ olu ụtọ Devid. 21  Jehova, ọ bụ n’ike gị ka eze na-aṅụrị ọṅụ;+ Leekwa ka o si chọọ ịdị na-aṅụrị ọṅụ nke ukwuu ná nzọpụta gị!+   I nyewo ya ihe na-agụ obi ya,+ Ị jụghị inye ya ihe egbugbere ọnụ ya chọrọ.+ Sila.   N’ihi na ị gọziri ya wee nye ya ihe ọma,+ I kpuwekwara ya okpueze ọlaedo a nụchara anụcha n’isi.+   Ọ rịọrọ ka i nye ya ndụ. I wee nye ya,+ Nyekwa ya ogologo ndụ ruo mgbe ebighị ebi, ọbụna ruo mgbe niile ebighị ebi.+   Ọ dị ebube nke ukwuu n’ihi nzọpụta gị.+ I yiwe ya ebube na ịma mma dị ka uwe.+   N’ihi na ị na-eme ka ọ bụrụ onye a gọziri agọzi nke ukwuu ruo mgbe ebighị ebi;+ Ị na-eji ọṅụ nke si n’ihu gị eme ka ọ ṅụrịa ọṅụ.+   N’ihi na eze tụkwasịrị Jehova obi,+ Tụkwasịkwa obi n’obiọma* nke Onye Kasị Elu. A gaghị eme ka ọ maa jijiji.+   Aka gị ga-enweta ndị iro gị niile;+ Aka nri gị ga-enweta ndị kpọrọ gị asị.   Ị ga-eme ka ha dị ka oké ọkụ nke na-enwu enwu n’oge a kara aka mgbe ị ga-eche ihu n’ebe ha nọ.+ Jehova ga-eloda ha n’iwe ya, ọkụ ga-erepịakwa ha.+ 10  Ị ga-ekpochapụ mkpụrụ ha n’ụwa,+ Kpochapụkwa ụmụ ha n’etiti ụmụ mmadụ.+ 11  N’ihi na ha emewo atụmatụ ime gị ihe ọjọọ;+ Ha echepụtawo ihe ha na-apụghị imezu.+ 12  N’ihi na ị ga-eji eriri ụta gị nke ị kwadebere iji buso ha agha+ Mee ka ha tụgharịa gbaa ọsọ.+ 13  Jehova, ka e bulie gị elu n’ike gị.+ Anyị ga-abụ abụ, bụọkwa abụ olu ụtọ banyere ịdị ike gị.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ, “ịhụnanya na-adịgide adịgide.”