Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet | BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Abụ Ọma 2:1-12

2  Gịnị mere mba niile ji na-agba ghara ghara,+Mba dị iche iche anọrọkwa na-atamu ihe efu?+   Ndị eze ụwa eguzorokwa,+Ndị isi ezukọtawokwa dị ka otu onye+Imegide Jehova+ na imegide onye o tere mmanụ,+   Sị: “Ka anyị dọbisịa agbụ ha,+Tọpụsịakwa ụdọ ha kere anyị!”+   Onye ahụ nke nọ ọdụ n’eluigwe+ ga-achị ọchị;Jehova ga-akwa ha emo.+   N’oge ahụ, ọ ga-agwa ha okwu n’iwe ya,+Ọ ga-emekwa ka ha maa jijiji n’iwe ya dị ọkụ,+   Sị: “Mụ onwe m emewo ka eze m nọdụ n’ocheeze+Na Zayọn,+ bụ́ ugwu nsọ m.”+   Ka m kwuo ihe Jehova nyere n’iwu;Ọ gwara m, sị: “Ị bụ ọkpara m;+Mụ onwe m aghọwo nna gị taa.+   Rịọ m,+ ka m nye gị mba dị iche iche ka ha bụrụ ihe nketa gị,+Nyekwa gị nsọtụ niile nke ụwa ka ha bụrụ ihe onwunwe gị.+   Ị ga-eji mkpanaka ígwè kụpịa ha,+Ị ga-akụri ha ka arịa ọkpụite kpụrụ.”+ 10  Ugbu a kwa, unu ndị eze, jirinụ nghọta mee ihe;Kwenụ ka a gbazie unu, unu ndị ikpe nke ụwa.+ 11  Jirinụ egwu jeere Jehova ozi,+Jirikwanụ ịma jijiji ṅụrịa ọṅụ.+ 12  Susuonụ ọkpara ya ọnụ,+ ka O wee ghara iwe iwe,Ka unu wee ghara ịla n’iyi wee si n’ụzọ pụọ,+N’ihi na iwe ya na-adị ọkụ ngwa ngwa.+Obi ụtọ na-adịrị ndị niile na-agbaba n’ime ya.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji