Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet | BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Abụ Ọma 19:1-14

Ntụziaka e nyere onye nduzi. Abụ olu ụtọ Devid. 19  Eluigwe na-akọsa ebube Chineke;+Mbara igwe na-akọkwa ọrụ aka ya.+   Ụbọchị ọ bụla na-eme ka okwu na-asọ ka mmiri,+Abalị ọ bụla na-egosipụta ihe ọmụma.+   Ha anaghị ekwu okwu, ha anaghịkwa ekwu ihe ọ bụla;A naghị anụ olu ha.+   Eriri ha ji atụ̀ ihe agazuwo ụwa dum,+Olu ha eruwokwa na nsọtụ elu ala.+Chineke amaworo anyanwụ ụlọikwuu n’ime ya,+   Ọ dịkwa ka nwoke na-alụ nwaanyị ọhụrụ mgbe o si n’ụlọ ndina ya na-apụta;+O ji ọṅụ na-agba n’ụzọ ya dị ka dike nke ji ọṅụ na-agba ọsọ.+   Ọ na-esi n’otu nsọtụ nke eluigwe apụta,Ebe ọ na-aga bụkwa na nsọtụ ya nke ọzọ;+Ọ dịghịkwa ihe okpomọkụ ya na-adịghị emetụ.+   Iwu+ Jehova zuru okè,+ na-eweghachite mkpụrụ obi.+Ihe ncheta+ Jehova bụ ihe a pụrụ ịtụkwasị obi,+ na-eme ka onye na-amaghị ihe mara ihe.+   Iwu+ Jehova ziri ezi,+ na-eme ka obi ṅụrịa ọṅụ;+Ihe Jehova nyere n’iwu+ dị ọcha,+ na-eme ka anya na-enwu gbaa.+   Egwu+ Jehova dị ọcha, ọ na-adịru mgbe ebighị ebi.Mkpebi ikpe+ Jehova bụ eziokwu;+ ha niile ziri ezi.+ 10  Ha bụ ihe a na-achọsi ike karịa ọlaedo, ee, karịa ọlaedo dị ukwuu a nụchara anụcha;+Ha dịkwa ụtọ karịa mmanụ aṅụ+ na mmanụ aṅụ nke si n’ụgbụgbọ ya na-agụpụta.+ 11  E jiriwokwa ha dọọ ohu gị aka ná ntị;+Idebe ha na-eweta ụgwọ ọrụ dị ukwuu.+ 12  Ònye pụrụ ịghọta ihe o mehiere n’amaghị ama?+Gbaghara m mmehie m na-amaghị na m mere.+ 13  Ekwela ka ohu gị mee omume mpako;+Ekwela ka ọ chịa m.+Mgbe ahụ, m ga-abụ onye zuru ezu,+M ga-abụkwa onye na-emebighị iwu nke ukwuu. 14  Ka ihe ọnụ m na-ekwu na ihe m na-atụgharị n’uche+Bụrụ ihe na-atọ gị ụtọ, Jehova, Oké Nkume m+ na Onye Mgbapụta m.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji