Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet | BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Abụ Ọma 145:1-21

Abụ otuto, abụ ọma Devid. א [Alef] 145  Chineke m bụ́ Eze, m ga-eto gị,+M ga-agọzi aha gị ruo mgbe ebighị ebi, ọbụna ruo mgbe niile ebighị ebi.+ ב [Bet]   M ga-agọzi gị ogologo ụbọchị dum,+M ga-etokwa aha gị ruo mgbe ebighị ebi, ọbụna ruo mgbe niile ebighị ebi.+ ג [Gimel]   Jehova dị ukwuu, kwesịkwa nnọọ ka e too ya,+A pụghịkwa ịchọpụtacha ịdị ukwuu ya achọpụtacha.+ ד [Dalet]   Ọgbọ niile ga-aja ọrụ gị mma,+Ha ga-akọkwa akụkọ banyere oké ọrụ gị.+ ה [Hee]   M ga na-echebara oké ịma mma nke ebube gị echiche,+Na-echebakwara okwu banyere ọrụ gị ndị dị ebube echiche.+ ו [Wọọ]   Ha ga-ekwukwa banyere ịdị ike nke ihe dị egwu ị na-eme;+M ga-akọsakwa ịdị ukwuu gị.+ ז [Zayin]   Ha ga-ekwu okwu nke ukwuu banyere ịdị mma gị dị ukwuu,+Ha ga-etikwa mkpu ọṅụ n’ihi ezi omume gị.+ ח [Het]   Jehova na-eme amara, na-emekwa ebere,+Ọ dịghị ewe iwe ọsọ ọsọ, obiọma* ya dịkwa ukwuu.+ ט [Tet]   Jehova dị mma n’ebe ihe niile o kere eke nọ,+Ebere ya na-erutekwa ọrụ ya niile.+ י [Yod] 10  Jehova, ọrụ gị niile ga-eto gị,+Ndị na-eguzosi ike n’ebe ị nọ ga-agọzikwa gị.+ כ [Kaf] 11  Ha ga na-ekwu banyere ịdị ebube nke ọbụbụeze gị,+Ha ga na-ekwukwa banyere ịdị ike gị,+ ל [Lamed] 12  Iji mee ka ụmụ mmadụ mara oké ọrụ ya+Nakwa ebube nke ịma mma ọbụbụeze ya.+ מ [Mem] 13  Ọbụbụeze gị bụ ọbụbụeze na-adịru mgbe niile ebighị ebi,+Ịchịisi gị na-adịrukwa ọgbọ niile na-abịa abịa.+ ס [Samek] 14  Jehova na-akwado ndị niile na-ada ada,+Ọ na-ekulitekwa ndị niile huuru ehuru.+ ע [Ayin] 15  Ihe niile i kere eke nwere olileanya n’ebe ị nọ,+Ị na-enyekwa ha nri ha n’oge ya.+ פ [Pee] 16  Ị na-asaghe aka gị,+Were ihe na-agụ ihe ọ bụla dị ndụ nyejuo ya afọ.+ צ [Sadee] 17  Jehova bụ onye ezi omume n’ụzọ ya niile,+Ọ na-eguzosikwa ike n’ọrụ ya niile.+ ק [Kof] 18  Jehova nọ ndị niile na-akpọku ya nso,+Bụ́ ndị niile na-akpọku ya n’eziokwu.+ ר [Resh] 19  Ọ ga-emere ndị na-atụ egwu ya ihe na-agụ ha,+Ọ ga-anụkwa mkpu enyemaka ha na-eti, ọ ga-azọpụtakwa ha.+ ש [Shin] 20  Jehova na-eche ndị niile hụrụ ya n’anya nche,+Ma ọ ga-ala ndị ajọ omume niile n’iyi.+ ת [Tọọ] 21  Ọnụ m ga na-ekwupụta otuto Jehova;+Ka anụ ahụ́ niile gọziekwa aha nsọ ya ruo mgbe ebighị ebi, ọbụna ruo mgbe niile ebighị ebi.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ, “ịhụnanya na-adịgide adịgide.”