Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Họrọ asụsụ Igbo

Abụ Ọma 132:1-18

Abụ Nrịgo. 132  Jehova, biko, cheta mweda niile+E wedara Devid+ n’ala;   Otú o si ṅụọrọ Jehova iyi,+Otú o si kwe Dike+ nke Jekọb nkwa, sị:+   “Agaghị m abanye n’ụlọikwuu bụ́ ụlọ m.+Agaghị m arịgoro n’ihe ndina bụ́ nnukwu ihe ndina m,+   Agaghị m ekwe ka ụra gaa m n’anya,+Agaghịkwa m ekwe ka anya m nke na-enwu gbaa roo ụra,+   Ruo mgbe m chọtaara Jehova otu ebe,+Mgbe m chọtaara Dike nke Jekọb nnukwu ụlọikwuu.”+   Lee! Anyị anụwo ya n’Efrata,+Anyị ahụwo ya n’oké ọhịa.+   Ka anyị bata n’ụlọikwuu ya dị ebube;+Ka anyị kpọọ isiala n’ebe mgbakwasị ụkwụ ya.+   Jehova, biko, bilie baa n’ebe izu ike gị,+Gị na Igbe+ nke ike gị.+   Ka ndị nchụàjà gị yiri ezi omume dị ka uwe,+Ka ndị na-eguzosi ike n’ebe ị nọ tiekwa mkpu ọṅụ.+ 10  Ajụla ige onye i tere mmanụ ntị,+N’ihi Devid bụ́ ohu gị.+ 11  Jehova aṅụworo Devid iyi,+N’ezie, ọ gaghị ahapụ imezu ya:+“M ga-eme ka mkpụrụ nke afọ gị+Nọkwasị n’ocheeze gị.+ 12  Ọ bụrụ na ụmụ gị edebe ọgbụgba ndụ m+Na ihe ncheta m ga-akụziri ha,+Ụmụ ha kwa ga-anọkwasị n’ocheeze gị+Ruo mgbe ebighị ebi.”+ 13  N’ihi na Jehova ahọrọwo Zayọn;+Ọ gụsiwo ya agụụ ike ka ọ bụrụ ebe obibi ya, ọ sịrị:+ 14  “Nke a bụ ebe izu ike m ruo mgbe ebighị ebi;+N’ebe a ka m ga-ebi, n’ihi na ọ gụsiwo m agụụ ike.+ 15  Aghaghị m ịgọzi ihe oriri ya.+M ga-emekwa ka ihe oriri ju ndị ogbenye bi n’ime ya afọ.+ 16  M ga-eyiwe ndị nchụàjà ya nzọpụta dị ka uwe;+Ndị ya na-eguzosi ike n’ihe aghaghịkwa iti mkpu ọṅụ. 17  M ga-eme ka mpi Devid pulite n’ebe ahụ.+Edoworo m onye m tere mmanụ oriọna n’usoro.+ 18  M ga-eyiwe ndị iro ya ihere dị ka uwe;+Ma okpueze ya+ ga-enwe ihe ịga nke ọma.”+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji