Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Họrọ asụsụ Igbo

Abụ Ọma 131:1-3

Abụ Nrịgo. Abụ ọma Devid. 131  Jehova, obi m adịghị mpako,+Anya m adịghịkwa elu;+Etinyeghịkwa m aka n’ịchọ oké ihe,+Ma ọ bụ n’ihe m na-apụghị ịghọta.+   N’ezie, emewo m ka mkpụrụ obi m jụrụ, meekwa ka ọ nọrọ jụụ+Dị ka nwata a kwụsịrị ara nke nne ya ku.+N’ime m, mkpụrụ obi m dị ka nwata a kwụsịrị ara.+   Ka Izrel chere Jehova+Malite ugbu a gaa n’ihu, ruo mgbe ebighị ebi.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji