Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet | BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Abụ Ọma 130:1-8

Abụ Nrịgo. 130  Jehova, anọ m n’ime ogbu mmiri kpọkuo gị.+   Jehova, biko, nụrụ olu m.+ Ka ntị gị nụkwa olu arịrịọ m.+   A sị na ọ bụ njehie ka ị na-ele,+ Jaa, Jehova, ònye pụrụ iguzo?+   N’ihi na ezi mgbaghara dị n’aka gị,+ Ka e wee na-atụ egwu gị.+   Atụwo m anya enyemaka gị, Jehova, mkpụrụ obi m atụwo anya enyemaka gị,+ Echerewo m okwu gị.+   Mkpụrụ obi m echerewo Jehova+ Karịa ka ndị nche na-eche ka chi bọọ,+ Ndị na-eche ka chi bọọ.+   Ka Izrel na-echere Jehova.+ N’ihi na Jehova nwere obiọma,*+ Mgbapụta dị ukwuu dịkwa n’aka ya.+   Ọ ga-agbapụtakwa Izrel ná njehie ya niile.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ, “ịhụnanya na-adịgide adịgide.”