Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet | BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Abụ Ọma 13:1-6

Ntụziaka e nyere onye nduzi. Abụ olu ụtọ Devid. 13  Jehova, ruo ole mgbe ka ị ga-echefu m?+ Ọ̀ bụ ruo mgbe ebighị ebi?+Ruo ole mgbe ka ị ga-ewepụ ihu gị n’ebe m nọ?+   Ruo ole mgbe ka mkpụrụ obi m ga na-agba mgba,Ruo ole mgbe ka obi m ga na-eru uju ogologo ụbọchị dum?Ruo ole mgbe ka onye iro m ga na-aka m ike?+   Lee m anya; za m, Jehova Chineke m.Mee ka anya m na-enwu gbaa,+ ka m ghara ịda n’ụra ọnwụ,+   Ka onye iro m wee ghara ịsị: “Emeriela m ya!”Ka ndị na-emegide m wee ghara ịṅụrị ọṅụ n’ihi na e mere ka m na-adagharị adagharị.+   Ma mụ onwe m, n’obiọma* gị ka m tụkwasịrị obi;+Ka obi m ṅụrịa ọṅụ n’ihi nzọpụta gị.+   M ga-abụku Jehova abụ, n’ihi na o mesowo m mmeso ọma.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ, “ịhụnanya na-adịgide adịgide.”