Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet | BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Abụ Ọma 128:1-6

Abụ Nrịgo. 128  Obi ụtọ na-adịrị onye ọ bụla nke na-atụ egwu Jehova,+Onye na-eje ije n’ụzọ ya.+   N’ihi na ị ga-eri ihe aka gị rụpụtara.+Obi ụtọ ga-adịrị gị, ihe ga-agazikwara gị.+   Nwunye gị ga-adị ka osisi vaịn na-amị mkpụrụ+N’ime ime ụlọ gị.Ụmụ gị ga-adị ka ome osisi oliv+ gburugburu tebụl gị.   Lee! Otú ahụ ka a ga-esi gọzie dimkpa+Nke na-atụ egwu Jehova.+   Jehova ga-esi na Zayọn gọzie gị.+Hụkwa ọganihu Jeruselem ụbọchị niile nke ndụ gị,+   Hụkwa ụmụ ụmụ gị.+Ka udo dịrị Izrel.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji