Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet | BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Abụ Ọma 126:1-6

Abụ Nrịgo. 126  Mgbe Jehova kpọlatara ndị Zayọn a dọọrọ n’agha,+Ọ dị anyị ka ọ̀ bụ ná nrọ.+   Ọchị juru anyị ọnụ n’oge ahụ,+Mkpu ọṅụ jupụtakwara n’ire anyị.+Ha wee kwuwe n’etiti mba niile n’oge ahụ, sị:+“Jehova emewo oké ihe n’ihe o meere ha.”+   Jehova emewo oké ihe n’ihe o meere anyị.+Anyị na-aṅụrị ọṅụ.+   Jehova, biko, kpọlata ndị ala anyị a dọọrọ n’agha,+Dị ka ọwa mmiri ndị dị na Negeb.+   Ndị ji anya mmiri na-agha mkpụrụ+Ga-eji mkpu ọṅụ wee ihe ubi.+   Onye bu akpa nke mkpụrụ ọghịgha juru wee na-aga,+Ọbụna na-akwa ákwá,+Aghaghị iji mkpu ọṅụ+Buru ùkwù ọka* na-alọta.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ọka a na-ekwu okwu ya ebe a bụ ụdị dị ka ọka wit na ọka bali.