Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet | BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Abụ Ọma 122:1-9

Abụ Nrịgo. Abụ ọma Devid. 122  Aṅụrịrị m ọṅụ mgbe ha na-asị m:+ “Ka anyị gaa+ n’ụlọ Jehova.”+   Jeruselem, ụkwụ anyị guzo+ N’ime ọnụ ụzọ ámá gị.+   Jeruselem bụ ebe e wuru dị ka obodo+ Nke e jikọtara ọnụ ka ọ bụrụ otu,+   Ebe ebo dị iche iche na-agbago,+ Bụ́ ebo dị iche iche nke Jaa,+ Ịga nye aha Jehova ekele,+ Dị ka ihe ncheta o nyere Izrel si dị.+   N’ihi na ọ bụ n’ebe ahụ ka ocheeze ikpe dị,+ Bụ́ ocheeze ụlọ Devid.+   Rịọnụ arịrịọ ka Jeruselem nwee udo.+ Gị obodo, ndị hụrụ gị n’anya agaghị echegbu onwe ha.+   Ka udo dịgide n’ime ékpè gị,+ Ka nchegbu ghara ịdị n’ime ụlọ elu gị.+   M ga-ekwu okwu n’ihi ụmụnne m na ndị enyi m, sị:+ “Ka udo dị n’ime gị.”+   M ga na-achọ ọdịmma gị+ N’ihi ụlọ Jehova Chineke anyị.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji