Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet | BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Abụ Ọma 120:1-7

Abụ Nrịgo. 120  Akpọkuru m Jehova n’oge m nọ n’ahụhụ,+O wee za m.+   Jehova, biko, napụta mkpụrụ obi m n’egbugbere ọnụ nke na-ekwu okwu ụgha,+Nakwa n’ire na-aghọ aghụghọ.+   Gịnị ka mmadụ ga-enye gị, gịnịkwa ka mmadụ ga-atụkwasịrị gị,Gị ire na-aghọ aghụghọ?+   Ọ bụ akụ́ a pịrị apị nke dike,+Tinyere icheku ọkụ nke osisi brum.+   Efuola m, n’ihi na ebiriwo m dị ka ọbịa na Mishek!+Ebiriwo m n’ụlọikwuu m mara n’etiti ụlọikwuu ndị Kida.+   Mkpụrụ obi m ebiriwo n’ụlọikwuu ruo ogologo oge+N’etiti ndị kpọrọ udo asị.+   Achọrọ m udo;+ ma mgbe ọ bụla m kwuru okwu,Ha na-ejikere ịlụ agha.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji