Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Họrọ asụsụ Igbo

Abụ Ọma 118:1-29

118  Keleenụ Jehova, n’ihi na ọ dị mma;+N’ihi na obiọma ya na-adịru mgbe ebighị ebi.+   Ka Izrel kwuo, sị:“N’ihi na obiọma ya na-adịru mgbe ebighị ebi.”+   Ka ndị ụlọ Erọn kwuo, sị:+“N’ihi na obiọma ya na-adịru mgbe ebighị ebi.”+   Ka ndị na-atụ egwu Jehova kwuo, sị:+“N’ihi na obiọma ya na-adịru mgbe ebighị ebi.”+   Anọ m n’ọnọdụ ọjọọ kpọkuo Jaa;+Jaa zara m wee kpọba m n’ebe sara mbara.+   Jehova nọnyeere m; agaghị m atụ egwu.+Gịnị ka mmadụ pụrụ ime m?+   Jehova nọnyeere m, ya na ndị na-enyere m aka,+Ka m wee na-ele ndị kpọrọ m asị anya, na-achị ha ọchị.+   Ọ dị mma ịgbaba n’ime Jehova+Karịa ịtụkwasị mmadụ obi.+   Ọ dị mma ịgbaba n’ime Jehova+Karịa ịtụkwasị ndị a ma ama obi.+ 10  Mba niile gbara m gburugburu.+Ọ bụ aha Jehova ka m ji na-eguzogide ha.+ 11  Ha gbara m gburugburu, ee, ha gbara m gburugburu.+Ọ bụ aha Jehova ka m ji na-eguzogide ha. 12  Ha gbara m gburugburu dị ka aṅụ;+E menyụrụ ha dị ka ọkụ osisi ogwu.+Ọ bụ aha Jehova ka m ji na-eguzogide ha.+ 13  Ha kwasiri m aka ike ka m daa,+Ma Jehova nyeere m aka.+ 14  Jaa bụ ebe mgbaba m na ike m,+Ọ ghọkwaara m nzọpụta.+ 15  Mkpu ọṅụ na mkpu nzọpụta+Na-ada n’ụlọikwuu+ ndị ezi omume.+Aka nri Jehova na-akpa ike.+ 16  Aka nri Jehova na-eme onwe ya ka ọ dị elu;+Aka nri Jehova na-akpa ike.+ 17  Agaghị m anwụ, kama m ga na-adị ndụ,+Ka m wee kọsaa ọrụ Jaa.+ 18  Jaa gbaziri m n’ụzọ siri ike,+Ma o nyefeghị m n’aka ọnwụ.+ 19  Megheerenụ m ọnụ ụzọ ámá ezi omume.+M ga-abanye n’ime ya; m ga-eto Jaa.+ 20  Nke a bụ ọnụ ụzọ ámá Jehova.+Ndị ezi omume ga-abanye n’ime ya.+ 21  M ga-eto gị, n’ihi na ị zara m,+Ị ghọkwaara m nzọpụta.+ 22  Nkume ndị na-ewu ụlọ jụrụ ajụ+Aghọwo isi nkuku.+ 23  Ọ bụ Jehova mere ya;+Ọ dị ebube n’anya anyị.+ 24  Nke a bụ ụbọchị Jehova mere;+Anyị ga-aṅụrị ọṅụ, nweekwa obi ụtọ na ya.+ 25  Biko, Jehova, biko, zọpụta anyị!+Biko, Jehova, biko, mee ka ihe gaziere anyị!+ 26  Ka Onye na-abịa n’aha Jehova bụrụ onye a gọziri agọzi;+Anyị esiwo n’ụlọ Jehova gọzie unu.+ 27  Jehova bụ Chineke,+Ọ na-enye anyị ìhè.+Jirinụ alaka osisi+ chọọ ìgwè ndị kwụ n’ahịrị n’oge ememme mma;+Chọọnụ ha mma ruo na mpi ebe ịchụàjà.+ 28  Ị bụ Chineke m, m ga-etokwa gị;+Chineke m—m ga-ebuli gị elu.+ 29  Keleenụ Jehova, n’ihi na ọ dị mma;+N’ihi na obiọma ya na-adịru mgbe ebighị ebi.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji