Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet | BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Abụ Ọma 116:1-19

116  Ịhụnanya juru m obi n’ihi na Jehova na-anụ+Olu m na arịrịọ m.+   N’ihi na ọ tọworo m ntị n’ala,+M ga-akpọku ya ụbọchị ndụ m niile.+   Ụdọ ọnwụ gbara m gburugburu,+Anọ m n’ọnọdụ ọjọọ dị ka à ga-asị na m nọ na Shiol.+M nọ na-enwe ahụhụ na iru uju.+   Ma m kpọkuru aha Jehova, sị:+“Biko, Jehova, meere mkpụrụ obi m ụzọ mgbapụ!”+   Jehova na-eme amara, bụrụkwa onye ezi omume;+Chineke anyị bụkwa Onye na-eme ebere.+   Jehova na-echebe ndị na-amaghị ihe.+Ike gwụrụ m, o wee zọpụta m.+   Mkpụrụ obi m, laghachi n’ebe izu ike gị,+N’ihi na Jehova emesowo gị ihe n’ụzọ kwesịrị ekwesị.+   Ị napụtawo mkpụrụ obi m n’ọnwụ,+Napụtakwa anya m n’anya mmiri, napụtakwa ụkwụ m ka ọ ghara ịkpọ n’ihe.+   M ga-eje ije+ n’ihu Jehova n’ala ndị dị ndụ.+ 10  Ekwuru m okwu+ n’ihi na m nwere okwukwe.+E mekpara m ahụ́ nke ukwuu. 11  Mgbe ụjọ tụwara m, mụ onwe m sịrị:+“Mmadụ niile bụ ndị ụgha.”+ 12  Gịnị ka m ga-eji kwụọ Jehova ụgwọ+Uru niile ọ na-eme ka m rite?+ 13  M ga-eburu iko nke oké nzọpụta,+M ga-akpọkukwa aha Jehova.+ 14  M ga-emezu nkwa niile m kwere Jehova,+Ee, m ga-emezu ha n’ihu ndị ya niile. 15  Ọnwụ ndị na-eguzosi ike n’ebe Jehova nọDị oké ọnụ ahịa n’anya ya.+ 16  Biko, Jehova,+N’ihi na abụ m ohu gị.+Abụ m ohu gị, nwa ohu gị nwaanyị.+Ị tọpụwo agbụ e kere m.+ 17  Ọ bụ gị ka m ga-achụrụ àjà ekele,+Ọ bụkwa aha Jehova ka m ga-akpọku.+ 18  M ga-emezu nkwa niile m kwere Jehova,+Ee, m ga-emezu ha n’ihu ndị ya niile,+ 19  N’ogige ụlọ Jehova,+N’ime gị, Jeruselem.+Toonụ Jaa!+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji